Ndị nkuzi ga-amalite abụbọ ọrụ taa na Krọs Riva

Ụmụakwụkwọ na-akuzi onwe ha

Ebe foto si, AFP

A na-anụ kepu kepu na ndị nkuzi nọ na Cross-River steeti ahọpụtala taa dịka ụbọchị ha ga-ebido abụbọ ọrụ.

Ndị na-akwado ị me nke a bụ ndị nkụzị ụlọakwụkwọ pramarị nakwa sekondrị na gburugburu steeti ahụ.

Ha kwuru na iwe ha bụ na gọọmentị ha etinyeghị uche n'ihe gbasara ọdịnma ndị nkuzi na steeti ahụ.

"Anyị kwekọrịtara nke a mgbe anyị mechara nzụkọ gbasara omume gọọmentị steeti anyi n'ihe gbasara ọdịnma ndị nkuzi" bụ ihe onyeisi oche otu ndị nkuzi depụtara n'akwụkwọ ozi.

Abụbọ ọrụ ha ga-abụ nke usoro nke akpọrọ 'indefinite strike' na asụsụ bekee

N'akwụkwọ ozi ha nke onye odeakwụkwọ otu ndị nkuzi bụ R. Anyadike binyere aka ha depụtara ụfọdụ ihe gọọmentị steeti ha na-eme adịghị ha mma n'obi.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ