DSS ahapụla Abaribe, ọ ga-alaghachị ọrụ taa

Abaribe n'ụlọikpe

Ebe foto si, Uchenna Awom

Nkọwa foto, Ndị DSS agwaghị ya ihe ha jiri jide ya maọbụ ihe ha ji hapụ ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọ bụ n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Uche Awom ka ọ sị zie ozi a.

Ọ gwara BBC na ọ bụ ebe elekere isii n'ọma nke mgbede ka Abaribe nwereonwe ya n'aka ndị DSS jichiri ya kemgbe ụbọchị ise".

E nyere Abaribe ihe a kpọrọ 'administrative bail' na Bekee ma nyekwa ya n'aka ndị ọkaikpe na-anọchị anya ya, onye ndu ha bụ okaikpe ukwu Chukwuma-Machukwu Ume.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-aṅụrị maka mwereonwe Abaribe ma na-egosi ya na soshal midia.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

A nwụchịrị Abaribe n'ehihie ụbọchị Juunu 22 n'ekwughị ihe mere e jiri nwụchịe ya ma gakwa n'ụlọ ya ịme nyocha.

Anụkwara kepu kepu na ụfọdụ ndị so Abaribe gbochiri ndị DSS ịkpụrụ ya pụọ mgbe onye ọkaikpe ukwu nyechara ịkpe ya ụnyaahụ.

Abaribe na ndị so ya

Ebe foto si, Uche Awom

Nkọwa foto, O ji akwụkwọ a kpọrọ "Dirty politics" wee gaa ụlọikpe ụnyaahụ

Awom gwara BBC na ihe ndị so ya na-achọ bụ ịmaata ihe o mere e jiri nwụchie ya ma nyekwa ohere ịkwuchite ọnụ ya.

Ọ sị na ndị DSS jụrụ ịnye ya bụ ohere ma zakwa ajụjụ ihe ha jiri nwuchie ya, ha mechara si n'azụ ụlọ zupu ya n'ụlọikpe ahụ.

Mana ụlọikpe tinyere ụbọchị 14 ọnwa Nọvemba maka ikpe Nnamdi Kanu.

BBC Igbo ka na-agba mbọ ị nụ olu ndị DSS n'ihe gbasara okwu a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ