Plateau: 'Ha gburu nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m'
Ndị mmadụ apụtala ị mee akaebe maka mkpa mkpa para na Platu steeti ụbọchị ole na ole gara aga.
Chukwuemeka Eze bụ dibia bekee nọ n'ụlọọgwụ mgbe ebubatara ndị mmerụrụ ahụ kọwara BBC ihe ọ hụrụ.
Ọ sị na ebe niile n'esi ka ebe a na-abọ anụ n'ehihie ahụ n'ụlọgwụ mahadum nke Jọs ma tinye kwuo n'ọnụgụgụ ndị merụrụ ahụ kariri mmadụ iri ise.
Onye ọzọ ihe a metụtara bụ Ezekiel Danbwarang akọwarala BBC etu ndị ọchịehi siri gbuo ezinaụlọ ya.
"Ha tịkara ọnụ ụzọ m wee bata, m nụzie ụda egbe na mkpu nwụnyere m tiri m jiri mara na ha egbuola ezinaụlọ m"
N'ọnụ ya "Mgbe ha buuru ihe niile dị n'ime ụlọ m ka ha malitere gbaa ya bụ ụlọ ọkụ".

Ndị uweojii agaala Jos
Ụnyaahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris zigara ụfọdụ ndịuweojii na ụgbọelu helikọpta abụọ na Barkin Ladi na Riyom.
O zigakwuru ụgbọagha ise na ndị uweojii pụrụiche akpọrọ "police mobile force unit" tinyere ndị o zipụburu.
Ka ọ dị ugbua, onyeisiala Muhammadu Buhari edepụtala akwụkwọ ebe o kwuru na ụfọdụ mmadụ emeela ihe a ihe ndọrọndọrọ ọchịchị
Ọ rịọrọ ndị nsogbu a metụtara ha nwee ndidi ka iwu ala mezuo ọrụ ejiri hiwe ya.


Ebe foto si, Chuwang Dalyop

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










