JOHESU: Ụlọ ọgwụ Ọrthọpedic Enugwu dị ka ebe agbara ọsọ agha.

Ụlọọgwụ Orthopedic dị n'Enugwu tọgbọzịrị chakoo dịka ndị Joint Health workers union JOHESU n'aha ịchafụ ka nọkwa n'abụbọ ọrụ ha malitere n'onwa gara aga.
Ụlọọgwụ ahụ bụ ebe na ekwokarị ekwo dịzị ka ebe agbara ọsọ agha oge BBC gara na ya bụ ụlọọgwụ.
Otu nwaanyị na-eleta dị ya gbajịri ụkwụ n'ụlọọgwụ ahụ bụ oriakụ Precious Odi gwara BBC na kamgbe abụbọ ọrụ ahụ bidoro na onweghịzi ndị ọrụ dịka nọsụ, ndị na-ehicha ihe, ndị nleta nakwa na-asa ihe na-abia na-eleta ndị orịa.
Oriakụ Odi kwara arịrị na ihe na-emezi ugbua bụ na ndị dọkinta bịa dechaa ọgwụ ha apụọ hapụzịara ndị ụmụ nne onye na arịa ahụ ka ọrụbazịe ọrụ nọsụ na onye nleta.
O kwuru na ụfọdụ ndị ka fọrọ n'ụlọọgwụ ahụ amaghị ebe ma ọ bụ ihe ha ga-eme n'ihi na ha gbajịrị ọkpụkpụ.

Ngalaba ebe ụmụnwaanyị na-anọ, ebe a na-edose ndị ọrị nke 1 na ebe ụmụnwoke na-anọ, bụ mkpụrụ mmadụ ole na ole nọ na ya ebe ụlọ ebe esi elekọta ụlọọgwụ ahụ, ebe a na-akwụ ụgwọ, ebe a na-enye ọgwụ nakwa ebe ndị awara ahụ na-anọ bụ nke e jị nnukwu igido gbachie.

Akụkọ ga-amasị gị:







