Ọ bụ eziokwu na ọnụ ahịa ihe oriri dị icheiche agbadatala?

ahịa osikapa na nrị mkpụrụ ibe ya

Ebe foto si, AFP

Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ akụnaụba obodo bụ nke akpọrọ National Bureau of Statistics (NBS) n'asụsụ Bekee depụtara n'akwụkwọ na ọnụ ahịa ejiri la pesent 0.86 gbadata.

Ọnụọgụgụ a bụ nke ọnwa eprelu bụ ugboro iri na ise ọnụọgụgụ a na-ada kemgbe ebidoro ị gụ ọnụọgụgụ a.

E kwụkwara na ọnụ ahịa nke ime obodo bụ nke bekee kpọrọ "rụral inflation" siri na pesent 12.99 rida na pesent 12.13 n'ọnwa eprelu kwa.

Otu onye na-azụ ahịa na ahịa Oyingbo na Legọs bụ Grace Ogbonna gwara BBC Igbo na-ekwe ntị na ọnụ ahịa a emetụtaghị nrị ndị ha na-ere ere n'ahịa.

Oriakụ Ogbonna kwuru na nrị dịka osikapa, agwa, garri na mmanụ nrị tinyechara ego ma enyocha ya kemgbe afọ gara aga.

Ahịa ebe a na-ere ngwa ofe bekee

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Tomato na-adị arị elu n'oge udu mmiri.

Gee ihe Grace Ogbonna gwara BBC Igbo n'uju

Aha onyonyo, Ọnụ ahịa adaala n'ezie?
Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line