Ndị ome iwu si na ha ga etinye anya n'ụlọakụ di icheiche

CBN kwuru na ha n'atara ụlọakụ ndị ọzọ ọnụ egọ nde naịra abụọ na ọma nke ha mịpụrụ n'ego ndị mmadụ ha chekwara n'oba ego

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, CBN kwuru na ha n'atara ụlọakụ ndị ọzọ ọnụ egọ nde naịra abụọ na ọma nke ha mịpụrụ n'ego ndị mmadụ ha chekwara n'oba ego

Ndị Sịnetị emela mkpebi inyocha ụlọakụ dị na Naịjirịa maka ụzọ n'ezighi ezi ha ji amịpụ ego ndị ahịa ha tinyere n'ụlọakụ nchekwa.

Ndị weputara atụmatụ butara mkpebi a bụ Sịnetọ Magnus Abe na ndị Sinetọ iri abụọ na abụọ ndị ọzọ nke ha kpọrọ ' Mkpa ọ dị inyocha, idozi na imezi nsogbu dịna ụzọ n'ezighi ezi ndị ụlọakụ ukwu CBN jiri elekọta ndị mmadụ ụlọakụ ndị ọzọ mịpụrụ egọ ha n'ụzọ iwu na-akwadoghi'.

Ha kwerikọtara na Gọọmenti Etiti ga gbalị kpuchie ikike dịrị ndị ahịa, gbochie akwuzughi ego mmụba na mmịpụ ego ha n'ụzọ n'ezighiezi.

Ndị Sịnetị gwara ndị kọmitti na-ahụ maka ụlọakụ, mkpuchi akụ na okwu ego ka ha mme ihe nkwupụta ọha ma kpọọ kwa onyeisi ụlọakụ CBN bụ Godwin Emefiele na ndị ọrụ ya, gunyere ndị ụlọakụ ọzọ oku.

Ihe nkwupụta ọha ahụ ga-enwogharị ma mezịe iwu na usoro metutara mkpuchi ndị ahịa ụlọakụ ma gboo nsogbu dị n'ịmịpụ ego ha.

Sịnetọ Abe kwuru "Oruela ọtụtụ afọ ndị ụlọakụ bidoro ikpa agwa ọjọọ ịmịpụ ego ndị mmadụ n'ụzọ n'ezighi ezi nke megidere usoro ndị ụlọakụ ukwu CBN nyere n'iwu"

Ndị Sịnetị mara gbasara akụkọ ụlọakụ CBN wepụtara na ha n'atara ụlọakụ ndị ọzọ ọnụ egọ nde naịra abụọ na ọma nke ha mịpụrụ n'ego ndị ha chekwara n'oba ego.

Ha katọrọ agwa ndị ụlọakụ ukwu CBN maka nleda anya mkpesa ndị ahịa ụlọakụ kpesarala gbasara nsogbu a.

Akụkọ yiri ibe ya

Bitcoin bụ ego ọgbara ọhụrụ a na-ahụ anya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Bitcoin bụ ego ọgbara ọhụrụ a na-ahụ anya

Ndị ụlọ omee iwu Sịnetị adọla ụmụ Naịjịrịa akanantị gbasara itinye ego ha n'ego ọgbara ọhụrụ bụ Bitcoin ma gwa ndị ụlọakụ ukwu CBN, ụlọọrụ mgbanwe ego bụ Naịjirịa Stock Exchange, na ndị ụlọọrụ nchekwa ego na akụ dị icheiche ka ha mee ka ndị mmadụ mara aghọm dịna ego ọhụrụ bitcoins.

Ha gwara ndị ụlọ ọrụ National Orientation Agency "gbasa ozi megide ụlọakụ mmụba ego na ntabianya, na ụzọ mmụba ego ndị ọzọ dị icheiche dịna Naịjirịa.

Enyere ndị kọmitti Sịnetị na-ahụ maka ụlọakụ, mkpuchi akụ na okwu ego ịzụka abụọ ka ha mee enyocha gbasra uru na eziokwu dịna bitcoins dịka ụzọ azụma ahịa, ma wepụta usoro eji edozi ya.

Onye wepụtara atụmatụ a bụ Sịnatọ Benjamin Uwajumaogu kwuru na ụlọakụ ukwu CBN anabataghị bitcoin, ebe ọbụghị ihe a na-ahụ anya ma onweghi ụlọakụ mọọbụ Gọọmentị ọ bụla n'echekwa usoro ya.