Gọọmenti etiti ọ na-ahọrọ mkpebi ụlọikpe?

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara iwu Naijiria na ikike dịrị onye akatọla gọọmenti etiti dịka o si gbasa ebubo na ha na-ahọrọ mkpebi ụlọikpe ka ọ sị masị ha.
Na nkọwa ha, ha kwuru na nke a ga-ebute nsogbu nye ikpenkwụmọtọ na ọchịchị onyekwueucheya.
Kemgbe onyeisiala Muhammadụ Buhari ji banye n'ọchịchị n'afọ 2015, e nwela ọtụtụ mkpebi gbasara ndị nwere agba n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, nke gọọmenti nupuru isii na ya.
Ha gụnyere:

Mkpebi ụlọikpe ndị gọọmentị etiti gbahapụrụ
1. Mkpebi ka a tọhapụ Ibrahim El Zakzaky, onye a kpọchiri kemgbe Disemba 14, 2015
2. Mkpebi ka a tọhapụ onye bụbu onye ndụmọdụ gọọmenti n'ihe gbasara nchekwa bụ Sambo Dasuki
3. Mkpebi ụlọikpe nyere maka Nnamdị Kalu, onye ndu otu Ipob
4. Mkpebi maka Olisa Metu, onyebụbu odeeakwụkwọ mgbasaozi PDP
5. Mkpebi e nyere ka ahapụ Dino Melaye
6. Mkpebi ikwupụta ego ole ha nwetara n'ego e zupụrụ na nke e nyere SERAP

Ọkammụta n'ihe gbasara iwu bụ Chidi Odinkalu sị, "Ilebaa anya ị ga-ahụ ọtụtụ ikpe ekperela gọọmenti achọghị ime."
Odinkalu onye bụbụ onyeisioche (National Human Rights Commission) NHRC kwuru na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị mebicha nhazi iwu ala anyị(rule of law), na oge nyekwa nsogbu oge maa pụtara n'ọchịchi inweta ikpemkwụmọtọ.

Ebe foto si, Getty Images
N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Collins Okeke kwuru na nnupụsị gọọmenti na ige ntị na mkpebi ụlọikpe ga-eme ka "ọgbaghara dị n'obodo".
"Ndị mmadụ ga-ebido sobe ihe gọọmenti na-eme kwusị ige ụlọikpe, onye ọbụla a na-emezi ihe sọrọ ya."
Okeke kwuru na gọọmenti kwesiri ịna atọ ezi mkpụrụ site na ime ihe ụlọikpe kwuru ka ọchịchị onye kwuo uche ya were tọọ atọ n'ala Naijiria.
Ọ bụghị sọ ndị ọkaiwu na-akatọ agwa a gọọmentị etiti na-akpa.

Ebe foto si, Getty Images
Abali ole na ole gara aga, otu na-agba mbọ maka ikike dịrị mmadụ nke a kpọrọ Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) na bekee kpere gọọmenti Naijiria n'aka United Nations.
SERAP na-ebo gọọmentị ebubo na ha na-ege ntị na naanị mkpebi ụlọikpe masịrị ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.
Otu a kwuru na oke nnupụ isi na mkpebi ụlọikpe na-emegidere nkwụsị ike nke iwu ala anyị na nkwuruonwe nke ngalaba na-ahụ maka ikpe(judiciary.)
Gee ihe Odinkalụ kwuru n'uju:

Akụkọ ga-amasị gị:











