JOHESU: Ụlọọgwụ UNTH amalitela ọrụ n'uju.

Ndị ọrụ so na otu JOHESU akwụsila abụbọ ọrụ ahụ ha malịtere izu ụka atọ gara aga.BBC gara na ụlọọgwụ UNTH dị n'Enugwu iji chọpụta ka ọrụ si aga, wee hụ na ndị ọrụ amalitela n'uju.
Ngalaba dịka nke ndị si n'ụlọ abịa nleta nke a kpọrọ "out patients", nke nleta mkpụrụobi (Heart center) nakwa nhazi(Administration) bụ nke ndị ọrụ juru na ya.
Otu Nwanyị bịara ụlọọgwụ ahụ bụ Cecilia Anyachebelu kelere Chukwu na gọọmentị na ndị ọrụ enwela nghọta nke mere na ya du nwa ya nwoke nwere oghere n'obi were bia maka iwa ya obi.Nwanyị ọzọ kpọ nwa ya bịa na UNTH bụ Okwudili Iloputaife kwuru na obi dị ya ụtọ na abụbụọrụ ahụ ebiela.
Ndị JOHESU na-ana gọọmentị ọtụtụ ihe dị iche iche nke gụnyere ụgwọ onwa gbagotere karịa ka ọ dị ugbua nakwa ihe ndị ọzọ.




