Gọọmentị etiti akatọọla JOHESU maka mfanyeaka n'ụkwụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Gọọmentị etiti akatọọla ndị mfanyeaka n'ụkwụ ndị JOHESU

Ebe foto si, @IsaacFAdewole
Gọọmentị etiti akatọọla akwụkwọ ozi otu na-ahụ maka ndị nwe obirinajịọcha degara ya maka nfanyeaka n'ụkwụ
Mịnịsta ahụike bụ Isaac Adewole kwuru na otu a kwesiri ịkwụsị ike n'ụzọ ime udo na bụghị ịkpa oke.
Ndị ụka Katọlik na Naịjirịa emeela ngagharị iwe taa

Ebe foto si, Michael Obinna
Ndị ụka Katọlik na Naịjirịa emezuola ọkwa ha maara nụ nke ndị Bịshọp ụka ahụ n'izuụka gara aga kwuru na ha ga-eme ngagharị iwe taa na Naịjirịa niile.
Ngagharịnke a bụ maka ndị ụka ha egwuru na Benue Steeti.
Trump na Moon na-akwado mkparịta ụka

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Moon jae-in na-akwado enwe mkparịta ụka maka ihe mgbakwoji anya dị n'ụka ha na ndị Nọt Korịa.
Cheta na Nọt Korịa kwuru na ha nwereike igbahapụ mkparịta ụka ya na mba Amerịka.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu manchester City n'oge gara aga bụ manuel Pellegrini ewerela ọkwa dịka ichịkọta West Ham United
Ndidi, Iheanacho,Omeruo, Eze na ndị ọzọ awụchiela na Akwa Ibom maka njikere asọmpi Iko mba ụwa na ndị ọzọ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











