Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Ipob chọrọ ịtinye aja na garị Ọhaneze
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojịị ashụsala otu Ipob ebe ha bịara ị bute ọgbaghara na nzụkọ ndị Ohaneze ndị Igbo mere maka hazigharịa Naịjirịa. Ndị amama n'ala Igbo na ndị mba mmiri bịara ọgbakọ ahụ.
Na mba ofesi, United Arab Emirate sị ndị mba uwa bịawa

Ebe foto si, @HHShkMohd
Ndị mba United Arab Emirate emeghela ụzọ be ha sị onye ọbụla jị ịkpeghe ịmeghe ụlọọrụ maọbụ ịzụ ahịa batawa.
Ha na enye visa afọ iri zuruezu maka onye ọbụla tozuru ịme nke a.
Olisa Metuh dara n'ụlọikpa Abuja n'ụtụtụ a

Ebe foto si, Channelstv
Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi otu PDP bụ Olisa metuh atụbọla n'ụlọikpe Abuja n'ụtụtụa a.
A na ebo Metuh ebubo nde narị Naịra anọ nke asị na o bubara mgbe ha na-achị.
N'egwuregwu,

N'egwuruegwu, dịka mba Spain họpụtara ndị ga eso asọmpị iko mba uwa nke a afọ a, ọpụtala ihe na Alvaro na akpara Cheslea bọlụ agaghị esọ sọọ mpị ahụ.
Nwaamadịa, n'ọba ọzị twitter ya nabatara ọnọdụa na obi ọcha.











