Olisa Metuh adala n'ụlọikpe dị n'Abuja

Olisa Metuh

Ebe foto si, Channelstv

Nkọwa foto, Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye bụbụ onye ode akwụkwọ mgbasa ozi pati nọ bụ n'ọchịchị bụ nke akpọrọ Peoples Democratic Party n'asụsụ Bekee bụ Oliseh Metuh dara n'ime ụlọikpe ka ikpe ya malitere tata.

Ihe a mere na ụlọipke ukwu dị n'Abụja taa bụ Monde, ụbọchị 21 nke ọnwa Mee.

Metuh nọ n'ụzọ ị ga ebe a na-akpọsa ndị a na-ekpe ikpe mgbe ọ dara.

Ọkaikpe kwụsịrị ikpe ahụ inye ohere ka ndị ọrụ ahụike leta ya ahụ.

Gọọmentị kpụgara Metuh ọlụikpe ka ọzara ọnụ ya banyere nde naira 400 ha sị metụtara ego onye bụbụ onye ndụmọdụ Naịjirịa bụ Sambo Dasuki.

Na ọnwa Febụwarị n'afọ a Metuh gara ụlọikpe n'elu akwa ụkọọgwụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Emeka Etiaba, bụ ọkaiwu Metuh gwabụrụ ọkaịkpe na onye ọ na-anọchite anya agaghị abịalị ụlọikpe mana ọkaiwu sị ya bịa.

Metuh gakwara ụlọikpe n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ịrịọ ohere ị ga mba ofesi maka ọgwụgwọ, mana ụlọikpe ahu ekweghị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ