Olisa Metuh adala n'ụlọikpe dị n'Abuja

Ebe foto si, Channelstv
Onye bụbụ onye ode akwụkwọ mgbasa ozi pati nọ bụ n'ọchịchị bụ nke akpọrọ Peoples Democratic Party n'asụsụ Bekee bụ Oliseh Metuh dara n'ime ụlọikpe ka ikpe ya malitere tata.
Ihe a mere na ụlọipke ukwu dị n'Abụja taa bụ Monde, ụbọchị 21 nke ọnwa Mee.
Metuh nọ n'ụzọ ị ga ebe a na-akpọsa ndị a na-ekpe ikpe mgbe ọ dara.
Ọkaikpe kwụsịrị ikpe ahụ inye ohere ka ndị ọrụ ahụike leta ya ahụ.
Gọọmentị kpụgara Metuh ọlụikpe ka ọzara ọnụ ya banyere nde naira 400 ha sị metụtara ego onye bụbụ onye ndụmọdụ Naịjirịa bụ Sambo Dasuki.
Na ọnwa Febụwarị n'afọ a Metuh gara ụlọikpe n'elu akwa ụkọọgwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Emeka Etiaba, bụ ọkaiwu Metuh gwabụrụ ọkaịkpe na onye ọ na-anọchite anya agaghị abịalị ụlọikpe mana ọkaiwu sị ya bịa.
Metuh gakwara ụlọikpe n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ịrịọ ohere ị ga mba ofesi maka ọgwụgwọ, mana ụlọikpe ahu ekweghị.

Akụkọ ga-amasị gị:










