E nwere ike iwa Olisa Metuh ahụ

Ebe foto si, Channelstv
Onye na-ekwuchite ọnụ ya bụ Sam Ben-Nwosu gwara BBC na ọ nọ n'ụlọ ọgwụ kemgbe ụbọchị anọ gara aga.
Ben-Nwosu sị na ihe na-arịa Metuh bụ ọrịa ọkpụkpụ azụ nke pụtara.
Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-abuga Metụ ụlọ ọgwụ ọzọ (nke ga-eme ya atọ) n'Enugwu iji nwe odido anya ịmata ma a ga-awa ya ahụ.
Cheta na a gba ọsọ buga Metuh nnukwu ụlọ ọgwụ, Nnamdi Azikiwe Teaching Hospitalụ dị na Nnewi Anambra Steeti ka ọ dara ahụ.





