Ihe a gbatara na Premier League: Man Utd meriri, Chelsea dara

Ebe foto si, Getty Images
Manchester United agaghịchala n'ọkwa nke abụọ na Premier League site na mmeri ha meriri Chelsea n'Old Trafford.
Lukaku na Jesse Lingard nyere goolu abụọ Man Utd ji merie n'agbanyeghị na Willian bụ onye Chelsea bu ụzọ nye otu goolu.
Agụfuru otu goolu nke onye Chelsea bụ Alvaro Morata nyere, maka na-ọkwụghị ebe ọ kwesịrị ịkwụ oge ọ metụrụ bọọlụ ahụ.
Mmeri e meriri Chelsea pụtara na ha ga-anọ n'ọkwa nke ise, nke nwere ike ime ka ha hapụ isonye n'asọmpi Champions League nke afọ ọzọ a ga-agba, maka na Tottenham nọbu n'ọkwa ise meriri ndị nke ha.
Ọ pụtara na ọ bụ nanị otu mmeri ka ha nwetarala n'ime asọmpi anọ ikpeazụ ha gbarala na Premier League.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Tottenham agbagoola ọkwa nke anọ ka ha merichara ndị Crystal Palace nọ n'ọkwa 17.
Mmeri ha meriri Crystal Palace dọtịrị oge ha sọrọmpi a na-emeribeghị ha ruo 15 n'asọmpi n'ile ha na-agba.
Tottenham nke Mauricio Pochettino na-achịkọta bụ otu egwuregwu a na-emeribeghị na Premier League kamgbe 2018, n'agbanyeghị na mmeri nke taa bụ nke atọ ha na-enweta n'ime iri ha na-agbaghị na be ha.










