Ihe a gbatara na Premier League: Liverpool meriri, Swansea dara

Ebe foto si, Getty Images
Liverpool jidesiri aka ike n'inweta ohere ịgba Champions League site na mmeri ha meriri ndị West Ham, ebe e meriri ndị West Brom ọzọ nke kpalitere okwu ọpụpụ ha na Premier League.
Liverpool gbara ndị West Ham 4-1 na be ha n'Anfield nke mere ka ha gbagoo n'ọkwa nke abụọ, jiri pọintị ise na-aga Tottenham bụ ndị nọ n'ọkwa nke ise, ndị ga-asọmpi nke ha echi.
Ndị Huddersfield ji 2-1 merie West Brom, nke mere na ọ bụ nanị otu mmeri ka ha nwetarala n'ime asọmpi 14 ha gbarala kamgbe Alan Pardew ji bụrụ onye nchịkọta ha.
N'aka ọzọ, Swansea agaghachịla n'ebe ndị nwere ike isi na Premier League pụọ ka ndị Brighton merichara ha.
Emerighị ndị Swansea n'ime asọmpi ise ha gbaburu ka ha nọ n'okpuru nchịkọta Carlos Carvalhal, mana eji 4-1 merie ha n'ọgbọ egwuregwu Amex. Ha nọ n'ọkwa 18 ebe ọ bụ okpụ ole ha nwere bụ ihe mere ka Southampton na Crystal Palace kara ha, ebe ọ bụ nanị pọintị asaa na-azọ West Brom ndụ.
N'akụkọ ọzọ, goolu Jack Butland bụ onye na-echere ndị Stoke City bọọlụ ji aka ya nye onwe ya mere ka ha na ndị Leicester City gbaa nhata nha 1-1. Otu pọintị ahụ ha nwetara pụtara na Stoke City ka ga-anọ n'ọkwa 19 ha nọbu.
Southampton si n'ọkwa atọ ikpeazụ rịpụta ka ha na ndị Burnley bụ ndị n'emeribeghị otu mkpụrụ asọmpi n'afọ 2018, gbara nhata nha 1-1.
Bournemouth n'onwe ha si na mmeri lọghachịta bịa saa goolu abụọ Newcastle gbara ha na be ha, mere ka asọmpi ha gwụ na nhata nha 2-2.










