Etu NDLEA si jichie 'Cocaine' ruru 30bn naira

Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru naira billion iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo and Chioma Obianinwa

  1. Celta Vigo akụọrọla ndị Atletico Madrid ọrụ na be ha

    Atletico na Celta Vigo

    Ebe foto si, Reuters

    N'egwuregwu, Atletico Madrid na Celta Vigo ji ọkpụ goolu abụọ gbaa onwe ha onye nawa onye nawa n'asọmpi Spanish La Liga ha gbara ụnyaahụ.

    Luis Suarez nyere goolu abụọ mana ozughị ịnye ndị Atletico mmerị na be ha.

  2. Ọkaikpe aka chiburu Amerịka bụ Donald Trump akwọọla aka Pontius Pilate gbasara ọgbaghara ndị nsonso Trump

    Ngagharịiwe na Capitol

    Ebe foto si, Getty Images

    N'ofesi, Ọkaikpe aka chiburu Amerịka bụ Donald Trump akwọọla aka Pontius Pilate gbasara ọgbaghara ndị nsonso Trump mere na Capitol n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị.

    Ọkaikpe a kwuru na ihe ndị ahụ mere agbasaghị Trump dịka ha na-achọ ịmalite okwụ maka ịkpachapụ ya ka esụ n'ọchịchị nke ugboro abụọ n'ala ahụ.

  3. Ndị ụlọomeiwu ukwu ga-etinye ọnụ n'okwu gbasara ọgụ ndị ọchịehi nd ndị ọrụụgbọ

    Senate

    Ebe foto si, Senate

    Ụlọomeiwu ukwu Naịjriịa ehiwela taa bụ Tụzde dịka ụbọchị ha ga-etinye ọnụ n'ọkwụ gbasara ọgụ ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo n'ime obodo.

    Onye ndụ na Senate bụ Yahaya Abdullahi bụ onye gwara ndị ntaakụkọ nke a ụbọchị Mọnde.

  4. Onweghị onye ahụrụ nje coronavirus n'ahụ ya n'ọwụwa anyanwụ ụnyaahụ bụ Mọnde

    Ụlọọrụ NCDC ekwuola na ahụrụ nje coronavirus na ahụ mmadụ narị isii, iri anọ na atọ (643) ọhụrụ ụnyaahụ bụ Mọnde.

    Nke a mere ọnụọgụ ndị bụ ya bụ nje na Naịjirịa otu narị puku na iri anọ, narị atọ na iri itoolu na otu, (140,391) ebe onweghị ndị ahụrụ ya bụ nje n'ahụ n'ọnwụnwa anyanwụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Ndị be anyị unu asaala chi e! Ndụ nwoke ndụ nwaanyị taa bụ Afọ

  6. Tom Moore ebutela coronavirus

    Tom Moore

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, Tom Moore

    Tom Moore, nwoke mba England gbara afọ otu narị, ebutela nje coronavirus.

    Moore bụ nwoke ahụ aha ya gazuru ụwa niile n'ihi mbọ ọ gbara ịtụkọta ego iji nyere ngalaba ahụike mba ahụ aka maka ibuso ọrịa coronavirus agha.

    Site n'ịntaneetị nakwa soshal midia, Tom Moore tụkọtara ego karịrị nde paund iri atọ na atọ maka ngalaba 'National Health Service' (NHS).

    Nwa ya nwaanyị bụ Hannah Ingram-Moore dere na nna ya nwere obere nhịahụ iku ume mana e burula ya gaa ụlọọgwụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    N'ihi mbọ ọ gbara n'oge ahụ, gọọmentị mba England nyere Tom Moore nkwanye ugwu pụrụ iche.

    Ezenwaanyị Eliza tunyekwara ya ugo dịka onye 'Knight'.

    Praịm Mịnịsta Boris Johnson kwuru na ha na-ekpere Tom Moore ekpere ka ọ gbakee nke ọma.

  7. Ot Al Shabab awakpola ụlọ oriri na nkwari na Mogadishu

    Al Shabab

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị otu Al Shabab

    Akụkọ si mba Somalia apụta na-ekwu na otu Al Shabab awakpola otu ụlọ oriri na nkwari a kpọrọ Hotel Afrik nke dị na Mogadishu.

    Akụkọ kwuru na a nụla ụda ogbunigwe atọ dịka ya bụ mwakpo na-aga n'ihu.

    N'ozi ha zipụrụ n'ọba ozi ha, Al Shabab kwuru na ọ bụ ndị ọrụ gọọmentị na-enwe ọgbakọ n'ụlọ oriri ahụ ka ha na-ede.

    Ndị agha mba Sọmalia nọkwa n'ụlọ oriri ahụ na-ebuso ndị ekperima ahụ agha.

    O dobeghị anya ugbu a ma o nwere ndị nwụrụ na mwakpo a.

    Al-Shabab bụ otu a kpọpụtara dịka otu na-eyi ndụ egwu.

  8. Gee akụkọ n'otu nkeji

  9. Mba Israel ga-enye mba Palestin ọgwụ mgbochi puku ise

    Nwatakịrị mba Palestin na-anata ọgwụ mgbochi covid-19

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Israel ekwuola na ha ga-enye ndị ọrụ ahụike mba Palestin ọgwụ mgbochi covid-19 puku ise.

    Ngalaba UN na-ekwu na ọ bụ mba Israel ka ọ dịịrị ịhụ na ndị mba Palestin nwetara ya bụ ọgwụ kama mba Israel na-ekwu na ọ bụghị maka nkwekọrịta ọbụla ka ha ji eme nke a.

    Na-agbanyeghị na mba Israel nọ na mmachị, ihe ruru passenti iri abụo (20%) ndị mba ahụ anatala ọgwụ mgbochi covid-19.

    Enwebeghi ihe ndị mba Palestin kwuru maka nke a.

  10. "Anyị ga-akpụpụ ndị gbara nwkekọrịta nde £492 anyị na Lionel Messi n'anwụ ụlọikpe" Barcelona

    Lionel Messi

    Ebe foto si, Reuters

    Otu Barcelona ekwuola na ha ga-akpụpụ ụlọọrụ ntaakụkọ El Mondo ụlọikpe maka ịgba nkwekọrịta ha na Lionel Messi nke ruru pawụnd nde narị anọ na iri itolu na abụọ n'anwụ.

    Barcelona gọrọ aka na ụkwụ were sị na ọbụghị ha gbara ya bụ nkwekọrịta n'anwụ.

    El Mundo dere na Messi ga-erite yuro 555,237,619 tutu ụbọchị iri atọ nke ọnwa Jun afọ 2021.

    Nke a pụtara na Messi na-eri pawụnd otu narị na iri abụọ na atọ kwa otu afọ bọolụ.

    Messi bidoro ịgbara otu Barcelona bọọlụ kama o tinyere akwụkwo n'ọnwa Ọgụst 2020 na ya chọrọ isi otu ahụ pụọ.

  11. Gọọmentị kwesịrị itinye iwu ga-amachi mkpagharị ndị ọchịehi na Naịjirịa - Ganduje

    Abdullahi Umar Ganduje

    Ebe foto si, SALIHU TANKO YAKASAI

    Nkọwa foto, Abdullahi Umar Ganduje

    Gọvanọ Kano Steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje chọrọ ka e tinye iwu imachi ndị ọchị ehi isi mpaghara Ugwu gaa mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ Punch kwuru na Ganduje kwuru nke a oge ụfọdụ ndị gọvanọ na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara obere ọgbakọ n'obodo ya na Daura, Katsina steeti.

    Ganduje kwuru na ọ bụrụ na emeghị iwu a, ọgbaaghara na-adị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ubi agaghị ebi ebi.

    "Onweghị etu ọzọ anyị ga-esinwu gbochie ọgbaaghara ndị a na-adapụta kwa mgbe kwa mgbe ma ọ bụrụ na enweghị iwu ịmachị mkpagharị ndị ọchị ehi."

    Ganduje nyekwara ndị isi nchekwa ọhụrụ Onyeisiala Buhari họrọ n'ọrụ ka ha na ndị gọvanọ na-arụkọ ọrụ iji nweta nchekwa zuru oke.

    Nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ubi eteela aka ọ na-enye nsogbu na Naịjirịa.

    Ya bụ ọgbaaghara ataala isi ọtụtụ mmadụ ma butekwa mmebi akụnụba nke apụghị ịgbakọ ọnụego ha.

  12. Ma ndị Igbo ejikọghị ọnụ, ọchịchị Naịjirịa agaghị eru ha aka - Reno Omokri

    Reno Omokri na Peter Obi

    Ebe foto si, Instagram/Reno Omokri

    Nkọwa foto, Reno Omokri na Peter Obi

    "Ọ bụrụ na ndị Igbo ejikọghị ọnụ, agaghị enwe ihe ọbụla dịka Igbo Presidency."

    Onye kwuru nke a bụ Reno Omokri, bubu onye enyemaka mgbasaozi Goodluck Jonathan oge ọ chịrị Naịjirịa.

    N'ozi nke o dere n'akara soshal midia ya, Reno Omokri kwuru na adịghị n'otu bụ nnukwu ihe ji ndị Igbo ime ka okwu ha na-ada ụda na Naịjirịa.

    Omokri kwuru na ihe ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa ji nweta ọchịchị n'afọ 1999 bụ maka na ha gbakọtara ọnụ.

    Ọzọkwa, n'afọ 2003, "ndị mpaghara Ugwu wepụtara otu onye -Muhammadu Buhari, ndị Ọdịa Anyanwụ wepụtara otu onye - Olusegun Obasanjo, mana ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ wepụtara ọtụtụ mmadụ - Ojukwu, Nwobodo, Kalu na Ike Nwachukwu."

    Omokri gara n'ihu kwuo sị: "Anaghị ewere ike ọchịchị nye mmadụ n'aka. Ọ bụ mmadụ ga-azọ ọchịchị tupu e nye ya. Naanị ịdịkọ n'otu ka ndị Igbo ga-eji nweta ọkwa onyeisiala. Mana dịka ọ dị ugbua na 2021, ndị Igbo adịghị n'otu ma ncha."

  13. Aka akparala ụmụ okorobị abụọ ji ụmụaka eme onyonyo aramara

    Ndị e boro ebubo 'child pornography'

    Ebe foto si, Nigeria police

    Ndị uweojii Naịjirịa ejidela ụmụokorobịa abụọ na-eji ụmụaka eme onyonyo aramara, bụ nke bekee kpọrọ 'child pornography'.

    Akwụkwọ ozi si n'aka ndị uweojii kwuru na a nwụchiri mmadụ abụọ a na Kano.

    Aha ha bụ Ibrahim Muazzam Mohammad Aminu na Mohammad Tahir Umar.

    Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ọ bụ ngalaba uweojii mbaụwa a kpọrọ 'Interpol' wetara ozi maka ụmụokorobịa abụọ a.

    "Ihe anyị natara ha gụnyere ekwentị atọ na otu igwe kọmputa 'laptop'," nke a bụ ihe ndị uweojii depụtara n'akwụkwọ ozi ha.

    "Oge e nyochara kọmputa na ekwentị ahụ, anyị hụrụ ihe onyonyo aramara e jicha ụmụaka mee bụ nke ha zigara n'akara ịntaneetị dị icheiche ma nara ego na dọla."

    Ndị uweojii kwuru na a ga-akpụpụ ndị ahụ n'ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha.

  14. Lee nwata afọ isii riri amusu na 'computer programming'

    Kautilya Kataria

    Ebe foto si, KautilyaKatariya.com

    Nkọwa foto, Kautilya Katariya bụ onye ji nzere 'Guiness Book of Records' maka onye 'computer programmer' afọ ya kacha dị nta

    Kautilya Katariya ka nọ na praịmarị nke abụọ mana o nweela ọtụtụ asambodo n'ịrụpa ihe na kọmputer nke a kpọrọ 'Computer programming' na bekee.

    Mana ihe kacha gbaa ụwa gharịị bụ na Kautilya Katariya amụtaghị ihe ndị a n'ụlọakwụkwọ, kama ọ bụ na ihe onyonyo na nkuzi o nwetara na kọmputa.

    Dịka o si depụta n'ọbaozi ya, Kautilya Katariya kwuru na ọ bụ oge e mechiri akwụkwọ n'ihi coronavirus ka nne na nna ya ji chọọ ụzọ ọ ga-eji mụọ ihe na ịntaneetị.

    Ha chọtaara ya ihe ọmụ si n'aka ụlọọrụ IBM nakwa Microsoft, o wee malite ịmụ ihe gbasara 'computer programming.'

    Naanị ọnwa asaa ka o were Kautilya Katariya iji bụrụ ọkaibe na ihe niile gbasara ọmụmụ kọmputa.

    Asambodo Kautilya Katariya

    Ebe foto si, KautilyaKatariya.com

    Nkọwa foto, Kautilya Katariya enwetela ọtụtụ asambodo bụ nke ọtụtụ ndị okenye ga-agụ akwụkwọ ọtụtụ afọ tupu ha enweta

    Nna nwata a bụ Ishwari Katariya kwuru na nwa ya emeela ya na nna ya nnukwu obi ụtọ dịka o nwetara nzere 'Guiness Book of Records' maka onye 'computer programmer' afọ ya kacha dị nta.

    Mana o kwuru na ha ka na-enye ya ọzụzụ iji tozuo ihe ọbụla ọ chọrọ ime na ndụ ya.

    Ishwari Katariya kwuru sị: "Kautilya eleela ule isii n'aka IBM ma nweta asambodo ndị ọkachamara, mana anyị na-enye ya ọzụzụ maka ule abụọ ọzọ ọ na-akwado ile iji nweta nzere na ngalaba a kpọrọ 'Applied Artificial Intelligence'.

  15. 'Pump' Chelsea agbawakwala ọzọ

    Chelsea

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nke a bụ mmeri mbụ Chelsea na-enweta kamgbe ha chụchara Frank Lampard n'ọrụ dịka onye nkuzi ha

    Chelsea amalitela ikpori ndụ ọzọ dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie Burnley n'ụbọchị Sọnde.

    Ceazer Azpilicueta na Fernando Alonso nyere goolu abụọ ahụ Chelsea ji nweta mmeri.

    Nke a bụ mmeri mbụ Chelsea na-enweta kamgbe ha chụchara Frank Lampard n'ọrụ dịka onye nkuzi ha, ma họrọ Thomos Tuchel iji nọchie ya.

    Mmerie a bulitere Chelsea n'ọkwa ndị nke asaa na tebulu 'English Premier League'.

    Chelsea nwere akara iri atọ na atọ (33) ugbua mana ha agbaala asọmpi abụọ karịa Tottenham na Everton bụ ndị nwekwara akara iri atọ na atọ n'isi onwe ha n'otu n'otu.

  16. Etu NDLEA si jichie 'Cocaine' ruru 30bn naira

    Ọgwụike e jichiri

    Ebe foto si, @UNODC_WCAfrica

    Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru uIjeri naira iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.

    E jichiri ọgwụ ike ruru etu ahụ n'otu izu ụka díka Gen.Mohammed Buba Marwa bụ onyeisi ọhụrụ ngalaba ahụ batachara oche ahụ ọhụrụ a.

    Etu e si jichie ndị bu ọgwụ ike ndị a ruru 30 billion naira

    Onye ụlọ ọrụ ngalaba ahụ kwuru na n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa January,2021 ka anwụchiri nwaanyị na-eme njem aha ya bụ Onyejegbu Ifesinachi Jennifer dị afọ iri atọ na atọ si mba Sao Paulo, Brazil 'via' Addis Ababa bata Naịjirịa.

    Mgbe ndị ọrụ Ndlea degidere nwaanyị ahụ, dete ya, ha kpọrọ ya gaa ebe ha mere ezigbo nyocha wee chọpụta ihe na-acha ọcha ezomiri n'akwa ruru isii n'ime akpa ya abụọ.

    Ha gara n'ihu nwalee ma chọpụta na ihe ahụ bụ ọgwụ ike ndị bekee kpọrọ 'Cocaine' na-anyị arụ ruru 26.850kg bụ nke o kwuru kachasị kamgbe afọ iri na ise ha jichiwere ndị na-ebu ọgwụ.

    O kwuru na ọnụego 26.850kg ruru 21 billion naira ebe nwaanyị ahụ bụ onye na-eme isi gwara ha na ọ bụ 2 million naira ka a ga-enye ya maka wefete ya bụ ọgwụ ike na Naịjirịa. Nwaanyị ahụ ekweghị akpọpụta ndị ya na ya so arụkọ ọrụ ibufete ọgwụ ike dịka ụlọ ọrụ Channels si depụta.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. "Ọ bụ eziokwu na ewepụtara mpempe mgbọ n'ahụ ndị nọ na Lekki" - Dọkịta ụlọọgwụ Reddington

    Lekki

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu onye dọkịta ekwuola na ewepụtara mpe mpe mgbọ n’ime ahụ ndị mmadụ bịara n’ụlọogwụ Reddington n’abalị echeere na ndị agha gbara ndị na-eme ngagharịiwe Endsars egbe na Lekki dị na Legọs.

    Babajide Lawson bụ dọkịta ahụ kwuru na ha mere ihe niile n'usoro kwesiri ekwesi n'ịgwọ mmadụ.

    O kwuru nke a na ngalaba ehibere iji nyocha mpụ si n'aka ndị uweojii pụrụiche akpọrọ SARS.

    O kwetakwara na ọ bụ eziokwu na ebutere ndị mmadụ n'ụlọọgwụ ahụ ịnata ọgwụgwọ n'abalị ahụ mana ha edetughi aha mmadụ niile.

    Gọọmentị etiti na ndị agha Naịjirịa ka na-ekwu na o nweghi ihe ọjọọ ha mere na ya bụ mgbagbu mere na Lekki.

  18. Mmadụ iri abụọ anwụọla na mberede okporoụzọ na Kwara

    Mmadụ iri abụọ anwụola na mba Kwara na mberede okporoụzọ bke ụgbọala atọ so n’ime ya.

    Ndị nche ụzọ kwukwara na mmadụ iri na otu ndị ọzọ ji isi ha pụta nọzị n’ụlọogwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

    N'ime mmadụ iri abụọ nwụrụ. ekwukwara na ozu mmadụ iri na asaa bụ nke ọkụ gbariri agbari.

    Onye nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ mgbe otu ụgbọala Toyota bụ ndị mmadụ na-achọ igbafe gwongworo bu ose ka ya na gwongworo na-abịa n'ihu kụkọtara isi.

    Eburula ndị nwụrụ gawa n'ụlọozu dị na steeti ahụ.

  19. Chelsea, Liverpool , WestHam na ndị ọzọ ga-eso gbaa asọmpị Premier League nke taa

    Chelsea na Burnley

    Ebe foto si, epa

    Asọmpị premier league ka na-ekpo ọkụ dịka Chelsea ga-ezute Burley n'ehihie taa n'elekere iri abụọ nke ehihie, Leicester na Leeds ga-akwata ya n'elekere abụọ nke ehihie, ebe West Ham na Liverpool ji okwu n'elekere anọ na ọkara nke mgbede, Brighton na Tottenham ga-amatakwa mbe n'abọ nke bụ oke n'elekere asaa na ụma nke mgbede.

    Chere aka ghọrọ dịka anyị ga-ewetere gị ka o si aga ma oge ahụ ruo.

  20. Mba UK na EU ga-ahazigharị mmekọrịta ha

    Vaccine

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Uk na European Union ga-ahazigharị mmekọrịta dị n'etiti ha dịka mba Brussels wepụtara atụmaatụ ibelata mbupu ọgwụ mgbochị covid 19 n'usoro Brexit.

    Ndị minista kwuru na obi siri ha ike na EU agaghị egbochi ọgwụ mgbochi covid 19 ibata mba UK.

    Nke a na-abịa dịka mba Brussels kagburu mkpebi ha kpebiburu maka inyocha ndị mmadụ n'oke ha na ndị Irish.