Johesu akpọghachila ndị ọrụ ahụike

A kpọchiri ụzọ ụlọọgwụ ahụ iji kwụsị ọbịbịa ndị mmadụ
Nkọwa foto, A kpọchiri ụzọ ụlọọgwụ ahụ iji kwụsị ọbịbịa ndị mmadụ

Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụike na Naijiria bụ Joint Health Sector Union (Johesu) na bekee agwala ndị otu ha ka ha lọghachi n'ọrụ echi bụ ụbọchị mbụ ọnwa Juunu.

Johesu kwupụtara nke a ụbọchị taa ka ha mechara ọgbakọ ndị isi ha n'Abụja.

Akwụkwọ ozi ha depụtara oge ha mechara ọgbakọ ahụ kwuru sị, "Dịka ndị isi nwechara mkparịtaụka, ha kwekọrịtara ikwụsị taa bụ Mee 31 n'ihi obi ọmịiko ndị otu anyị nwere n'ahụhụ nke dị ọha Naijiria na-ata ya na iji nye ohere maka mkparịtaụka maka udo nke ga-ebido ụbọchị Juunu 4".

Ha katọrọ gọọmentị maka ịhapụ imejupụta ọchịchọ ha.

Cheta na Johesu gbara abụbọ ọrụ abalị iri anọ na atọ (43) gara aga.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ