Unity in Nigeria: Ihe ise na-ejikọta ndị Naịjirịa

Ndị otiegwu Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọtụtụ oge ka ndị Naịjirịa ọkachasị ndị ntorobịa na-akọ ọnụ n'etiti onwe ha banyere agbụrụ ka ibe ya mma na mba a.

Ndị Igbo ga-asị na ọ bụ ha, ndị Yoruba ga-asịkwa na ọ bụ ha, ndị Awụsa na-ekwukwa na ọ bụ ha, ebe ndị agbụrụ ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ha.

Mana e nwere agbụrụ ka mma?

Ihe kacha mkpa bụ na n'agbanyeghị na e nwere agbụrụ dị iche iche na Naịjirịa, e nwere ihe ole na ole na-ejikọta agbụrụ niile ahụ.

Ihe ndị ahụ na-abụ o na-eme, ndị mmadụ echefuo agbụrụ nke ha, ma tinye uchu ha n'ikwado ya.

Ihe ndị na-ejikọta Naịjirịa

Ọtụtụ oge ka ndị Naịjirịa anaghị ekwekọrịta n'ụfọdụ ihe dịka ofufe na okwukwe ndị, ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ihe nkiri nke Bekee kpọrọ "movies".

Mana e nwere ihe ndị na-ejikọta Naịjirịa ọnụ dịka:

1) Egwuregwu bọọlụ

N'agbanyeghị na Naịjirịa na-esonye n'egwuregwu ndị ọzọ, enweghị ihe na-ejikọ onye ọbụla dịka mgbe ndị Super Eagles na-agba bọọlụ.

Ọ na-eme ụfọdụ ka ime ọ na-eme ha, nke bụ na ndị Naịjiria merie bọọlụ, anaghị asị "ọ bụ onye Igbo maọbụ Awụsa maọbụ Yoruba nyere goolu".

Mmeri otu egwu Naịjirịa bụ mmeri onye ọbụla, maka igwe mmadụ na-akwado ha n'ezinaụlọ ọbụla.

Otu egwuregwu Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị si agbụrụ dị icheiche mejuputara otu egwu bọọlụ Naịjirịa

Ị chọrọ ịma ma ihe a ọ bụ eziokwu, jụọ ndị mmadụ ese etu Iko Mbaụwa nke 2018 si gaa n'obodo ha.

Onye egwu Naịjirịa bụ Ahmed Musa tinyere ihe nkiri ebe o so ndị otu ya agụ egwu ụka (ọ bụ onye ụka alakụba), otu onye ụka alakụba ibe ya bịara gwa ya na o hikwara asaa n'anya tupu o mee ihe ahụ.

Musa sara ya sị ya mara onwe ya, nke mere ka ndị Naịjirịa si agbụrụ dị icheiche tinye ọnụ na-agba onye ahụ dere ihe ahụ ọnụ ọjọọ.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

2) Egwu

Egwu na-amasị onye ọbụla, n'agbanyeghị ụdịrị egwu ọ sọrọ ya bụrụ.

Mana a bịa na Naịjirịa, kama egwu ga-ese okwu, ihe ọzọ esee okwu.

Davido

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, David Adeleke a ma dịka Davido bụ otiegwu na-ewu ewu na Naịjirịa

Ọtụtụ ndị Igbo na-ege egwu Davido, ndị Yoruba na ndị Awụsa na-achọ ịma ihe Phyno na Flavour ji Igbo gụọ n'egwu ha.

N'ihi na egwu na-ejikọta mmadụ niile, ndị otiegwu amụtala iji asụsụ ọbụla masịrị ha agụ egwu.

Ọkwa Davido gụrụ egwu aha ya bụ "nwa baby" nakwa "Biko", Flavour agụọ "ololufe", Patoranking agụọ "Alubarika".

3) Ihe ịkpa ọchị

Otu ihe e ji mara ndị Naịjirịa bụ inwe aṅụrị n'agbanyeghị ọnọdụ ọbụla ha nọ n'ime ya.

Ya mere ọtụtụ ji ahụ ndị ọkpaọchị n'anya.

Basketmouth

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Bright Okpocha a ma dịka Basketmouth ji ịkpa ọchị akpa ego

Kwa afọ, a na-enwerucha ihe karịrị emume iri na gburugburu Naịjirịa, ebe ndị dịka Basketmouth, Bovi, Kenny Blaq, Ali Baba na ndị ọzọ na-abịa akpa ndị mmadụ ọchị.

Ugbua soshal midia na-ewu, ọtụtụ ndị achọtala na ịkpa ọchị bụ akara aka ha site na ya.

4) Nturuugo

Oge ndị Naịjirịa na-agbakọta ọnụ ọzọ bụ ma e nwee onye maọbụ ndị Naịjirịa nwetara nturuugo na mba ofesi.

Onye Naịjirịa (ma a mụrụ ya na Naịjirịa maọbụ onye a mụrụ na mba ọzọ ọbara Naịjirịa na-agba n'ime ya) metara ihe ọma e ji kpụrụ ya n'ọnụ na mbaụwa, abụrụla enyi onye Naịjirịa niile.

Ọmụmatụ bụ ụmụaka si Anambara steeti nwetara nturuugo n'ihe gbasara teknụzụ n'Amerịka.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Ọmụmatụ ọzọ bụ Anthony Joshua bụ nwa Naịjirịa na-apịara ndị Briten ọkpọ. Ọtụtụ ndị Naịjirịa hụrụ ya n'anya na-achọghị ịma agbụrụ o si.

5) Mkparị

Ị chọrọ ịma ma ndịnotu ọ dị ire na Naịjirịa, bụrụ onye mba ọzọ ma kpọọ Naịjirịa aha ọjọọ.

Ndị Naịjịrịa anaghị eji ntị anụ na ndị mba ọzọ kparịrị Naịjirịa maọbụ kpọọ ya aha ọjọọ.

Ahụ anaghị afọ ndị mere ya, ọkachasị n'elu soshal midia, makana ndị Naịjirịa na-apụta n'igwe gaa gwa onye ahụ ihe ọ gaghị echefu ọsịsọ.

Ọmụmatụ bụ oge ụfọdụ ndị Amerịka kparịrị Naịjirịa makana otiegwu J. Cole bịara ịgụ egwu ọ ka tiputara ọhụrụ.

Skip Instagram post, 3
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 3

Ọmụmatụ ọzọ bụ oge ndị Naịjirịa na Gana nakwa Kenya na Saụt Afrịka na-akọ ọnụ na soshal midia.

Ị gaa na Twitter chọọ "#SomeonetellKenyans" maọbụ "#SomeonetellGhanaians", ị ga-ahụ etu ndị Naịjirịa si apụta n'igwe akọ ndị mba a ọnụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ