Regina Pacis Onitsha: Ụlọakwụkwọ ahụ bụzị ebe a na-agba nkiri.

Ụlọakwụkwọ
Nkọwa foto, Ụmụ akwụkwọ nwaanyị ise a mere ihe nyere ndị nkụzị aṅụrị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mgbe BBC Igbo rutere na ya bụ ụlọ akwụkwọ ndị ụka katọlịk dị na n'onitsha, ụmụakwụkwọ juru ebe ahụ na-agụkwa akwụkwọ a na-achịkọba oge ezumike.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ na-ahụ maka ọdịmma ụmụ akwụkwọ bụ maazị Ken Nwoye kọwara na obi dị ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ niile ụtọ maka nturu ugo umu aka ise ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Nwoye kọwara na ụmụ aka ụmụnwaanyị ise ahụ nọ n'agbata afọ iri na atọ nakwa iri na ise, ma nọrọkwa na klaasị SS1.

O kwuru na ụmụaka ahụ rụpụtara akụrụngwa ahụ, a na-akpọ 'FD Detector' ma ọ bụ "Fake drug Detector' n'olu Bekee.

Ụlọakwụkwọ
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-aga nleta ụlọakwụkwọ Regina Pacis kamgbe ihe ọṅụ mechara

Nke a pụtara na akụrụngwa ahụ pụrụ igbochi mkpamkpa ọgwụ adịgboroja na-akpa na Naijịria.

O kwuru na ya bụ FD detector bụ nke ndị ụlọ orụ NAFDAC nabatagoro.

Ụmụ Regina Pacis

Ebe foto si, Ken Nwoye

Nkọwa foto, Ụmụ Regina Pacis na ndị nkụzị ha

Ndị ya na Regina Pacis zọrọ ya bụ asọmpi bụ ụlọakwụkwọ si mba 115 n'uwa niile bịa, ha tukwara ugo dịka ndị mbụ.

Aha ya bụ asọ mpi bụ World Technovation Challenge nke e mere na San Francisco na US.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ụmụaka turu ugo a bụ, Promise Nnalue, Jessica Osita, Nwabuaku Ossai, Adaeze Onuigbo na Vivian Okoye.

Otu 'Save-A-Soul'

Ebe foto si, Edufun Technik STEM center

Nkọwa foto, Ụmụada ise a si Regina Pacies Secondary School Onicha, 'Anambara steeti meriri n'asompi Technovation 2018

Iji kwanyere ụmụaka ahụ ugwu, onye commisioner na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Anambara steeti kwuru na ya ga na-eyị uwe akwụkwọ Regina Pacis aga ọrụ ruo otu ọnwa.

O bidoro nkwa a o kwere site n'iyi ya bụ uwe gaa ọrụ ụnyaahụ.

Okammuta Kate Azuka

Ebe foto si, Ken Nwoye

Nkọwa foto, Okammuta Kate Azuka kwuru na ya ga-eyị uwe ụlọakwụkwọ ahụ otu ọnwa

Onyeisiala ụlọakwụkwọ ahụ ụkọchukwu Fada Vincent Ezeaka ka dukwa ya bụ ụmụ aka nọrọ na mba Amerịka ebe ha na -kwadozị ịlọtawa.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: