Bayelsa:Tinye nwa gị n'ụlọakwụkwọ maọbụ ije nga

Ebe foto si, AFP
Steeti bara ụba na mmanụ ụgbọala bụ Bayelsa ga-emenye nne na nna na-ezigaghị ụmụ ha ụlọakwụkwọ egwu site na itunye ha n'ụlọmkpọrọ.
Steeti ahụ debanyere iwu ọhụrụ a n'akwụkwọ maka ụmụaka na-anaghị aga akwụkwọ n'agbanyeghị na gọọmentị mefuru ijeri naira 70 n'ụlọakwụkwọ na ngwọọrụ ụlọakwụkwọ.
Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Jonathan Obuebite kwuru na ha hụrụ na ọ dị mkpa itinye ya bụ iwu maka ichekwa ego steeti tinyere.
Akwụkwọ nke praịmarị na nke sekọndịrị bụ n'efu.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:


N'agbanyeghị nke a, ọtụtụ nne na nna na-egosi agwa ọgbasaghịm n'iziga ụmụ ha ịmụta akwụkwọ.
Otu ndị nkuzi na steeti ahụ ekwuola na mkpebị a dị mma, mana e kwesịrị ilebanye ọnọdụ ọbụla n'otu n'otu.
Otu onye n'ime otu ndị nkụzị bụ Kalama John Tonipre, gwara BBC na ọ bụrụ na-anwụchie nne na nna ọbụla, e kwesịrị ịchọpụta ihe bụ nsogbu.
"Ọ bụrụ na e mee ya n'ụzọ iwu, ọ dị mma."
Otonye Fatayi bi na Yenagoa sị na ya bụ iwu dị mma mana e kwesịrị inye ndị mmadụ ohere inabata ya ọfụma.









