INEC: Ugwu Awụsa kacha n'ọnụọgụgụ ndị tinyere aha maka ntuliaka

Ebe foto si, AFP
Ka Naịjiria na-akwado ibido ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nke afọ 2019,ngalaba na-ahụ maka ntuliaka aka bụ INEC ewepụtala ọtụtụ ọnụọgụgụ.
Ọnụọgụgụ nke a gosiri na mpaghara ugwu Naịjiria nwe karịchara ndị mmadụ denyere aha n'akwụkwọ ntuliaka.
Ndị na-esokwa ha n'azụ bụ steeti ndị nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ mana ndị nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ nọ n'ịkpeazụ.
INEC kwukwara na ndị anatabeghị akwụkwọ nke eji ga-eme ntụliaka ka nkụ. Sọsọ na Lagos, ka ha ruru mmadụ otu nde na ọkara.

Ka ọnụọgụgụ sị kwụrụ

Ebe foto si, AFP
- 18,505,984 - ndị denyere aha ntụliaka na mpaghara ugwu Naịjiria
- 14,626,800 - ndị denyere aha ntụliaka na mpaghara ndịda anyanwu Naịjiria
- 8,293,093 - ndị denyere aha ntuliaka na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjiria
- 73,944,312 - Ọnụọgụgụ ndị niile denyere aha ntuliaka na Naịjiria

E leba anya na ndị denyere aha na steetị dị ịcheịche, Lagos bu ụzọ, Kano n'eso ya na-azụ, Bayelsa burukwa ikpeazụ.
INEC kwukwara na ha ga-akwụsị ndenye aha nke a ma o rue ụbọchị iri isii tụpụ ntụliaka ebido.
Solomon Soyebi onye n'ahụ maka ndị ntụliaka na INEC sị na nke a pụtara maka iwu ntuliaka ọhụrụ etinyere.




