Gọv Gaidam: Oweghị anya ebe ụmụakwụkwọ ahụ nọ

Ebe foto si, Yobe State Government
Otu onye nkuzi n'obodo ahụ a chọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na mmadụ abụọ n'ime ụmụakwụkwọ ndị ahụ na-efu efu anwụọla.
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed, onye du ndị ọrụ gọọment gụnyere Mịnịsta obere na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Hajiya Khadija Abba, ga nleta n'obodo Dapchi kwuru na ụfọdụ ụmuakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị ahụ ka na-efu efu, na ọnweghị onye ma ebe ha nọ.
"Ka ọ si dị, e nwebeghị onye ma ebe ụfọdụ ụmụaka ndị a nọ. Nke a bụ n'ihi na ha ji nwayo na-alọghachị."
Mohammed ekwughị mmadụ ole na-efu efu maọbụ ole a zọpụtara.
Ka nke na-aga, ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Yobe steeeti bụ Abdullahi Bego ekwuola na akwụkwọ ozi ha wepụtara ebe ha kwuru na- agbapụtala ụmụakwụkwọ ndị ahụ atọrọla abụghị eziokwu.
Bego onye rịọrọ mgbaghara sịrị: " Anyị achọpụtala n'ozi ahụ anyị gbadoro ụkwụ were kwuo ya abụghị ezie."
Taa ka o mere abalị anọ ndị e chere na ha bụ Boko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ma tọrọ ihe karịrị ụmụaka ụmụnwaanyị iri itoolu.





