Ihe ise ị ga-eme iji chekwa onwe gi ma ị nọrọ n'ime Taxi

Oke mwakpo adị la n'elụ igwe okwu eji achọta ụgbọala

Ebe foto si, UBER

Nkọwa foto, Oke mwakpo adị la n'elụ igwe okwu eji achọta ụgbọala

Okwu na-ewu n'elu igwe okwu siri n'otu nwata nwanyi etipụla mkpụ maka mwakpo onye n'anya ụgbọala chọrọ ị wakpo ya.

Nke a bụtere arụmụka n'elu igwe okwu ebe ndị mmadụ na-egosi iwe ha maka ụdị ihe a na-eme.

Anyị na ndị abụọ ọnụ n'eru n'okwu gbasara nchekwa nwere nkata were wepụta ụzọ ise ị ga-ejị were chekwa onwe gị iji gbochi mwakpo n'ịme ụgbọala.

Kwụsị ị ga-ebe ọbụla na onwe gị

Ike dị na mmekọ mmadụ n'ibe ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ike dị na mmekọ mmadụ n'ibe ya

Ndị okachamara na okwu nchekwa gwara BBC na ihe na-egbochikari mwakpo bụ ma ndị mmadụ nọkọrita na-eme njem.

Ọ bụru na ị nweghị onye gị na ya ga-eso ọ dị kwa mma ka ị gwa ndị ezin'ụlọ gị maọbụ ndị enyi gị.

Saa anya gi

Dịri nkwadọ, saa anya gị maka .ịhe mberede

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dịri nkwadọ, saa anya gị maka .ịhe mberede

Tupu ịbanye ụgbọala ahụ ị nwere ike ịkpọ mmadụ gwa ha n'iru onye n'anya ụgbọala ahụ kọwara ha otu ụgbọala ha dị.

Mara ụzọ ebe ị na-aga

Onye mara ụzọ ọ gaghị efu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye mara ụzọ ọ gaghị efu

Ọbụrụ na ịmaghị ụzọ, ọ ga-adịrị onye chọrọ ịwakpo gị mfe ịme uche ya.

Muru anya dịrị njịkere

Ekwena ka oke ụra n'apụ gị ịhe na ndụ gị
Nkọwa foto, Ekwena ka oke ụra n'apụ gị ịhe na ndụ gị

Ụra dịnma na-ahụ mana ị rahụ ụra n'ịme ụgbọala taxi ga-enye onye ọ bụla chọrọ ịwakpo gi ohere iji mee ya.

Akwụsị la ebe ọbụla ọkụ adịghị

Onweghị ihe ọjọọ pụrụ ime n'ịhe
Nkọwa foto, Onweghị ihe ọjọọ pụrụ ime n'ịhe

Ọ dị mfe ịwakpo mmadụ n'ebe ọkụ adịghị nya mere ị ga-eji diri nche maka ebe gbara ọchịchịrị.

Ndị ọnụ n'eru n'okwu na ihe gbasara nchekwa nwekwara ndụmọdụ ha nyere ndị na-anya ụgbọala taxi.

Ha sị ha gaa ịbụte mmadụ, ha dịrị nkwucha gaa ọsọ ọsọ n'ebe ha nwere ike ikọwa dịka ụlọ obibi maọbụ ụlọ ọrụ maọbụ ụlọ akwukwo iji gbochi ndị ohi ịwakpo ha.