Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla ka ụbọchị itoolu gachara

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo bụ Femi Joseph agwala ndị ntaakụkọ na onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụfụola dika "News agency of Nigeria" si depụta.
Cheta na ọ na-arahụ ụra kamgbe ndị uweojii nwụchichara ya n'Ọgọstụ 5 ebe a na-ere ọgwụ.
Joseph kwuru na onye ntọ a nwurụ n'ụlọọgwụ dị na steeti ahụ ebe ndị dọkita Bekee nọ na-agba mbọ ịgwọ ya.
N'ọnụ ya, "Onye ntọ a a na-enyocha nwụrụ ka abalị itoolu anyị jiri nwụchie ya gachara. Anyị chere na anyị ga-agwọnwu ya ka o wee nyere anyị aka na nyocha anyị na-eme, mana ọ nwụrụ ụnyaahụ.''
"Ihe a nwere ike si n'ọgwU ike ọ ṅụrụ. "Anyị ji ohere a adụ ndị nne na nna ọdụ ka ha mara ụdịrị enyi ha na-enwe."
Akukọ kwuru na onye ntọ a gara ịtọ onye na-ere ọgwụ mana onye ahụ riri mbombo ọsọ.
Ya na ndị otu ya mechara nara otu onye bụ Daudu Wale ọgbatumtum ya, ebe ọ gara ịzụta ọgwụ ebe e nwudere otu onye n'ime ha.





