Onye ọkaiwu Evans esepụla aka n'ikpe ya

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Channels Tv sị kwuo, Olukoya Ogungbeje bụ onye ọkaiwu Chukwudumeme Onwuamadike ama dịka 'Evans' esila n'ihe gbasara okwu ya sepụ aka.
N'ime akwụkwọ Ogungbeje depụtara, o kwuru na ọ bụ maka ebumnuche ihe gbasara ya ka o ji mee nke a.
Ka akwụkwọ ahụ si kwuo, "Maranụ amara na anyị mere ihe ka o si kwesi n'agbanyeghị na a na-eyi ndụ m na ndụ ndị ọkaiwu m egwu maka ihe gbasara okwu a."
O kwukwara na ya na otu ndị ọkaịkpe ya jisike gosi iwu kwuru na "aka mmadụ niile kwụ ọtọ rue mgbe ịkpe ga-ama ha".
Cheta na Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa.
A ga-ebidokwa ikpe ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun bụ izuụka ọzọ na-abịa.





