N'Ọnịcha a tufuru nwa ọhụrụ n'ọwa mmiri

Ebe foto si, Getty Images
Ndị bi n'Ọnịcha tetera ụra Monde hụ nwa ọhụrụ a tụfuru n'ọwa mmiri.
Igwe mmadụ gbakọrọ n'akụkụ nnukwu ọwa mmiri dị n'ebe Ọgbọ-Efere, na nsonso Head-Bridge, Ọnịcha ikiri nwa ọhụrụ a tufuru ebe ahụ n'ụtụtụ taa bụ Monde.
Nke a na-eme ka o rubeghị otu izuụka e nwetara ozu nwa ọhụrụ n'akụkọ ọzọ n'Onicha.
O nweghị onye ma onye tufuru nwa ọhụrụ ahụ e jiri akwa na-acha ọbara-ọbara gbuchie.
Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC nwere otu onye bi n'Ọnịcha bụ Chidinma Ekwuzi gwarakwuru na a tụfuru nwa ọhụrụ ahụ n'ụzụ ụtụtụ taa.
Ekwuzi sị "Ọ bụ akwa nwa na-ebe n'isi ụtụtụ kpọtara ndị mmadụ ebe nwa ahụ dina.
"Onweghị onye ma onye dobere nwa ahụ n'owa mmiri ahụ miri emi nke ukwuu nke gọọmentị rụrụ maka igbochi idemmiri.
"Mana nzọ ụkwụ dị nso gosiri na onye mere ihe ahụ atụnyeghị ya bụ nwa n'ime ọwa mmiri atụnye. Owa mmiri ahụ miri ezi omimi."
Ọ gara n'ihu kọwaa na onweghị onye egwu kwere rue nso n'ihi egwu ihe ndị uweojii nwere ike ime.











