Akụkọ kachasị na mgbede a: Gọọmentị Anambra steeti nọ n'iru uju ugbua

Ebe foto si, Randie Chima/Facebook
Ezinaụlọ Mazi Randie Chima n'Anambra steeti nọ n'iruuju ugbua ebe anyị nụrụ na ya bụ nwoke anwụọla.
Ndi uweojii kwuru na ọ bụ ndị agbataobi ya gbakara ụzọ ya chọta ozu ya mgbe ha anụghị olu ya kemgbe ụbọchị fraide.
Mazi Randie Chima bụ onye enyemaka kachasi nke gọvanọ Willie Obiano n'ihe gbasara onyonyo na mgbasa ozi tupu ọ nwụọ.
Ọzọ,

Ebe foto si, APC/Twitter
Abubakar Shehu-Tambuwal bụbu otu onye ndu otu ndọrọndọrọ PDP na Sokoto steeti awufeela n'otu APC.
Tambuwal kwuru na ọ bụ n'ike aka ya ka o ji mee mkpebi a nakwa iji gosi na ọ kwadoro ọchịchị ziri ezi.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụaka abụọ so na mmadụ iri merụrụ ahụ n'obodo Manchester mgbe ndị ji egbe malitere ịgba egbe na mmemme ndị Karibean mere n'obodo ahụ taa
Dịka ọ dị ugbua ndị uweojii amabeghi ndị mere ya maọbụ ihe ha ji mee ya bụ ihe.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mancity enyela Arsenal otu ọkpụ goolu ka ha na achịpụ ya na Premier League ugbua
ebe Liverpool gwọrọ Westham ka abacha mgbe ha gbara ha ọkpụ anọ asataghị otu.
Gee Nkeji nke mgbede a
Ihe onyonyo nke taa













