Ọ bụ inwe mkpebi ime onwe nyere m ọrụ - Nwaafọ ji Pidgin akọwa bọọlụ

Aha onyonyo, Benjamin: Ọ bụ inwe mkpebi ime onwe nyere m ọrụ

Okenna Benjamin ji asụsụ pidgin kọwaa egwuregwu bọọlụ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke gara aga n'ụlọọrụ mgbasa ozi ndị Super Sports.

Na mkparịta ya na BBC Igbo, Benjamin kwuru na ọ bụ mkpebi nke ime onwe na ịhụ egwuregwu bọọlụ n'anya mere o ji nwete ọrụ ịkọwa asọmpi bọọlụ.

O kwuru na ụzọ eji eme nke ọma n'ịkọwa egwuregwu bọọlụ bụ ịhụ bọọlụ n'anya ịgụ akwụkwọ gbasara bọọlụ, ige ndị ka gị n'ọrụ bọolụ ntị nke ọma.