Ike Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ
Na mkparịtaụka Ikechukwu Uche bụ Nwafọ Igbo na-agbara Naịjirịa bọọlụ na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu njem ya jiri malite n'ịgba bọọlụ.
Uche kwuru na o bidoro mgbe ọ dị na nwata malite ịgba bọọlụ, ebe ọ buru ụzọ gbara otu Iwuanyanwụ bọọlụ tupu ọ gaa mba Spen bụ ebe ọ na-agba bọọlụ ugbua.
O kwuru na ebumnobi ya bụ ịgbara Naịjirịa bọọlụ nke bụ mgbe akpọrọ ya, obi dị ya ụtọ nke ukwuu.
Uche kwukwara na nwanne ya nwoke bụ Kalu Uche nyeere ya aka dịka o ṅomiri ya n'ịgba bọọlụ.
Ọ nyere ndị na-agba maọbụ chọrọ ịgba bọọlụ ndụmọdụ, kwuo na ọ bụ nrubeisi n'ala ka-eji agba bọọlụ nke ọma.
"Ọ bụ eziokwu na nne na nna m chọrọ ka m gụọ akwụkwọ mana a hụtara m onwe m n'ịgba bọọlụ.
Agbanyeghi na ha anọghị ya ugbua, ebe ọbụla ha nọ, obi ga-adị ha ụtọ nke ukwuu."
