Asaba 2018: Ndị egwuregwu tọrọ n'ọdọụgbọelu Legos eruola Asaba

Ọtụtụ n'ime ndị otu egwuregwu dị iche iche ndị larụrụ n'ọdọụgbọelu nke Legos n'abalị ụnyaahụ ruo ụtụtụ taa dịka ha na-aga asọmpi nke na-eme ugbua n'Asaba abataala Asaba.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Janine Anthony nọ n'Asaba kwuru na ha fedatara n'Asaba n'elekere ole na ole gara aga.
Cheta na akụkọ pụtara n'ụtụtụ a kwuru na ndị otu egwuregwu bịara Naịjiria maka asọmpị Africa Senior Atletics Championships na Bekee ka tọrọ na n'ọdọụgbọelu na Legos.
Ndị na-ahazi asọmpị a na-akọwa na ihe kachasị enye ha nsogbu bụ na okporoụzọ ụgbọelu ga-efedete pere ezigbo mpe na kwa na ụgbọelu buru ezigbo ibu, ya mere ha na-eji ụgbọelu pere mpe na-ebu ha.
BBC Igbo gbara Harrison Ochulor bụ onye onyeọrụ mgbasaozi ngalaba na-achịkọta asọmpi a ajụjụ ọnụ maka ihe mmere ndị jiri tọọ n'ọdọụgbọelu na Legos.
Ochulor gwara BBC Igbo na ọ na-ewute ha n'ụdị ihe a mere mana ọ bụghị ihe a kwesiri iji mee ndị ọrụ ya mkparị.

N'ọnụ okwu ya: "Ụdị ihe a bụ ihe na-eme ebe niile. Ndị Bekee kpọrọ ya 'logistical challenges.' Ọ bụghị ihe ọhụrụ"
O kwukwara na kama ịkwa ha emo, ndị mmadụ kwesiri ịkụrụ Asaba aka maka nnabata ha nabatara ndị otu egwuregwu a nakwa nchịkọta a chịkọtara asọmpi a.
Janine Anthony zitere ozi ụnyaahụ sị na ihere mere ndị na-ahazị asọmpi a maka na ọtụtụ n'ime ndị a tụrụ ugo nke a kpọrọ 'Hall of Fame' na Bekee, anọghị na ya bụ mmemme maka na ha ka tọrọ n'ọdọụgbọelu na Legos.
Ihe ndị mmadụ dere na Twitter
Mmadụ dịka @UsherKomugisha kọwara n'elu Twitter na ndị otu egwuregwu karịrị 300 tọrọ n'odọ ụgbọelu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọ bụ @magayijim bụ onye sere foto a mana Katami Michelle bụ onye ntaakụkọ egwuregwu dere na ya na-ahụ otu sị ala Kenya, Burundi, Eritea na Burkina Faso n'ime ndị tọrọ n'ebe a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
Akụkọ kwuru na otu dịka otu ala Kenya na-ekwusi ike na ha ga-alaghachị azụ ma ọ bụrụ na onweghị ụgbọala ga-ebu ha gawa Asaba.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Foto ka nku
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Lee ihe nkiri gosi ebe ha tọrọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Asọmpị a ga-ebido taa n'ime ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi dị n'Asaba taa ruo ụbọchị ise n'ọnwa Ọgọstụ a.
Akụkọ ga-amasị gị