Ndị ụlọomeiwu nta 38 hapụrụ APC gafee PDP na pati ndị ọzọ

Ebe foto si, Facebook/Nigerian HoR
Na-atụfughị oge ọtụtụ ndị ụlọomeiwu Sineti sicha na pati APC gafee PDP, ndị ụlọomeiwu nta ruru mmadụ iri atọ na asatọ si na pati dị iche iche agafeela PDP.
Nke a mere dịka ha nụrụ kepukepu na ndị ogbo ha nọ n'ụlọomeiwu sineti gafere n'otu PDP.
Oke ọpụpụ a ebutele arụmụka n'etiti ndị pati APC na PDP maka ndị nwe ụlọomeiwu ugbua.
Ndị gụnyere mmadụ anọ ndị APC gụnyere Olasupun Abiodun, Olubemi Samson na Akintola Taiwo si n'Oyo Steeti baa pati 'African Democratic Party' (ADP).
Ndị nke gara pati PDP dị mmadụ iri atọ na anọ gụnyere Sani Ranu, Aliyu Madaki, Dickson Takiu, Shehu Usman, Nasuru Garu, Garba Umar, Olayonu Dokpe, Emmanuel Udendi, Aminu Shehu Shagari, Kabiru Maraba, Abdulsaman Dasuki na ndị ọzọ.

Onyeisi ụlọomeiwu nta gụpụtara nke a site n'akwụkwọ ndị a degara ya.
Ndi pati APC ji obi ụtọ nabata ndị a batara n'otu dịka ha gosiri ya n'akara twitter ha.

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị pati APC kwuru na-agbanyeghi nke a mere, na ha kwụ chịm n'ala dịka pati nọ n'ọchịchị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










