World Cup 2018: Ugo Naịjirịa efeliela ọzọ ka ha sụrụ Aịsland ọkpụ abụọ

Ebe foto si, Lars Baron - FIFA
Ahmed Musa bụ onye na-agba n'ihu n'ime otu Super Eagles bụ onye nyere ọkpụ goolu abụọ n'ime asọmpi Naijiria na Aịsland.
Super Eagles na Argentina ga-asọ mpi nke ha n'ụbọchị 26 n'ime ọnwa Juun.
Asọmpi Naịjirịa na Aisland agwụchaala.
Nkeji 93: Mikel Obi emeruola ahụ n'aka.
Ha enyela ha oge ruru nkeji isi.
Nkeji 89: Alex Iwobi anọchiela anaya Etebo
Nkeji 85: Ighalo anọchịela Iheanacho
Nkeji 82: Aịsland agbafuola penarita ha.
Nkeji 81: Aịsland enweela Penalti
Nkeji 74: Goooooolu! Musa enyeela ọkpụ nke abụọ. Ọ bụ Kenneth Omeruo nyere ya aka.
Nkeji 70: Super Eagles enweela 'Corner' mana isi Balogun emetụghi na bọọlụ ọfụma.
Nkeji 65: Victor Moses na-agba mbọ nke ọma ị nye goolu.
Nkeji 63: Francis Uzoho azụọla ndị Super Eagles

Ebe foto si, Super Eagles
Nkeji 59: Ndị na-akwado otu aịsland na-akụ aka ịkpalịte ndị otu ha obi.
Nkeji 57: Aịsland na-achọ ị zaghachị ndị Super Eagles mana ụzọ adịghị
Nkeji 51: Ragnar Sigurdsson onye otu Aịsland emeruola ahụ maka ya na Musa kụkọtara isi.
Nkeji 49: Goooooolu!! Ahmed Musa enyeela goolu. Moses bụ onye nyere ya aka.
Brian Idowu apụọla, Tyronne Ebuehi bụ onye nọchịrị ya.
Agba nke abụọ ebidola
Enweela ezumike nkeji iri na ise
Nkeji 45: Enyekwala ha oge ruo nkeji abụọ.
Nkeji 43: Enyeela Bryan Idowu akwụkwọ ịdọ aka na ntị.
Nkeji 42: Super Eagles enweela 'corner' ọzọ mana agbafuru ya.
Njkeji 40: Musa enweela off-side.
Nkeji 36: Naịjịrịa enweela 'Free kick' mana agbafuola ya.
Nkeji 34: Victor Moses adaala ka o si ada.
Nkeji 32: Aịsland agbafuola 'free kick' ha.
Nkeji 26: Ọ bụ zị ndị Super Eagles na-agba sị ha ike.
Nkeji 24: Omeruo azọọla ndị Super Eagles.
Nkeji 22: Aịsland na-akwanya ọkụ n'ike ndị Super Eagles
Nkeji 20: Gylfi Sigurdsson onye otu Aịsland na-agba nke ọma mana ndị nche Super Eagles chebidoro ya.
Nkeji 15: Ndị Aịsland ka na-agba mbọ ị bata n'ụlọ Super Eagles mana ọ na-afịa ha ahụ.
Nkeji 13: Super Eagles enweela 'throw in'
Nkeji 11: Ndị Super Eagles ka na-agba mbọ ị banyere n'ime ụlọ ndị Aịsland mana ụzọ adịbe ugbua.
Nkeji 9: Ndị otu Naịjirịa na-agbasị ike ugbua mana ndị Aịsland chebidoro ha ebe niile.
Nkeji 7: Iheanacho agbaala 'corner' mana ọ banyeghị goolu.
Otu Nkeji: Ebidola bọọlụ n'ọgbọ egwuregwu Volgograd.
Ndị Aịsland bidoro bọọlụ: Hannes Thor Halldorsson; Hordur Bjorgvin Magnusson, Ragnar Sigurdsson, Kari Arnason, Birkir Mar Saevarsson; Birkir Bjarnason, Aron Gunnarsson, Gylfi Sigurdsson, Rurik Gislason; Jon Dadi Bodvarsson, Alfred Finnbogason.
Naịjirịa kwesiri ịgba mbọ merie n'asọmpị a ma ọbụrụ na ha ga-aga n'ihu n'Iko Mbaụwa.
Ndị Naịjirịa bidoro bọọlụ: Francis Uzoho, Kenneth Omeruo, William Troost-Ekong, Leon Balogun; Brian Idowu, Oghenekaro Etebo, John Obi Mikel, Wilfred Ndidi, Victor Moses, Ahmed Musa, Kelechi Iheanacho.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Akụkọ ga-amasị gị:













