Kedụ nwa afọ Igbo ahụ Buhari mere otu n'ime ndị isi CBN?

Ebe foto si, @bashirahmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari emela ọkammụta Justitia Nnabuko na mmadụ atọ ndị ọzọ gụnyere; Mike Obadan, Adeola Adetunji, nakwa ọkammụta Ummu Ahmed Jalingo dịka ndị isi ụlọakụ etiti, Sentralụ Bankị nke a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ.
Ọkwa ọrụ a nke bidorola n'abali asaa nke ọnwa Juun ka anọ afọ anọ.
Nnabụkọ bụbụ ọkammụta 'Marketing na University of Nigeria Nsukka ebe ọ kụzịrị nkuzi ihe karịrị afọ iri atọ.
Ọ rụkwara ụlọakụ First Bank ọrụ.
Onye odeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ Olusegun Adekunle, bụ onye kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi ezitere ndị ntaakụkọ.
Buhari gbatịkwara oge Ogbonnia Ibe-Enwo, dịka onyeisi ụlọakwụkwọ dị elu, Federal Polytechnic, Unwana Afikpo, dị n'Ebonyi steeti,bụ Dr. Ogbonnia Ibe-Enwo, agba nke abụọ ga-anọ afọ anọ bido n'abali asaa nke ọnwa Ọgọstụ.
Ndị ọzọ onyeisiala nyere ọkwa ọhụrụ gụnyere ọkammụta Abdullahi Yusuf, onye o mere onyeisi ụlọọgwụ University of Ilorin Teaching Hospital bido n'abali iri na itoolu Juun maka anọ.
Buhari gbatịkwara oge onyeisi ụlọakwụkwọ, the Federal Polytechnic, IIaro, Ogun State, Olusegun Aluko, maka agba nke abụọ ga-ebido na 'abalị 25 nke ọnwa Septemba.
Ọ gbatịkwara oge ọkammụta Sunday Onohaebi dịka onyeisi National Institute of Construction Technology, Uromi, dị n'Edo steeti agba nke abụọ bido n'abalị 25 nke ọnwa July.
Akwụkwọ ọzị ahụ kwuru na ọ tụtụ anya na ndịa e nyere ọkwa ọhụrụ ga-ahụ ya dịka oku ife ala nna anyị ma kwụwa aka ọtọ n'ọrụ ha iji mejupụta olileanya ndị mmadụ.









