World Cup 2018: Denmak emeriela Peruu

Ebe foto si, Getty Images
N'ime asọmpi Iko Mbaụwa dị n'etiti Peruu na Denmak bụ ndị nọ n'otu CH, ihe a bụ dịka o si gaa nkeji na nkeji.
Dịka ndị otu bọọlụ Peruu ndị yi uwe ọcha na Denmak ndị yi uwe ọbara ọbara pụtachara, ha gụrụ egwu eji maara mba ndị a bụ 'National Anthem' n'asụsụ bekee.
Nwafọ mba Denmak bụ Erikson gbapụrụ bọọlụ mgbe onye ogbu bọọlụ bụ Bakary Gassama nke Gambia gburu opi ya.
Na nkeji anọ na isii, ndị Peruu nwetere ohere ịgba bọọlụ n'efu bụ 'free kick' mgbe Farfan gbaturu Dalsgaard.
Ndị Denmak nwetere ' free kick' nke ha nkeji iri n'ime asọmpị ahụ ma ha gbafuru ya.
Onye Peruu bụ Tapia nwetere akwụkwọ ịdọ aka na ntị nke bụ 'yellow card' maka ịgbatu Sisto nke Denmak.
Nime nkeji iri anọ na ise agbakwunyere otu nkeji, Cueva onye mba Peruu tara ohere inye goolu site na penaụti.
Nkeji iri anọ na ise agbakwụnyere nkeji abụọ a lara ezumike ọkara nke bụ 'half time'
Trauco gbaturu Poulsen nke Denmak, ma nye ha ohere ị gba 'free kick' na nkeji iri ise na abụọ.
N'ime nkeji iri ise na itoolu Poulsen nyere goolu mgba osi n'okpuru onye oche bọọlụ ndị Peru bụ Gallese gbafe bọọlụ.
Cueva gbara ezigbo bọọlụ kpụ ọkụ dịka oche bọọlụ bụ ndị Denmak bụ Schmeiche gbochiri bọọlụ ị gafe ya na nkeji iri isii na itoolu.
Ndị Peruu gbalịsiri ike ka nyeta ndị Denmak goolu mana Denmak foro ntụtụ taa na ha agaghị ekwe ka nke a mee.
N'ikpeazụ Denmak ji ọkpụ otu merie ndị Peruu (Peruu 0 - 1 Denmak).













