World Cup 2018: Aịsịland na Ajentina agbaala onye laba onye laba

Ebe foto si, Getty Images
Ka Ajentina zutere ndị Iceland na asọmpị nke abụọ nke "Group C" ndị mmadụ nwere olileanya na ha ga-akwọrị ha.
Argentina nwere Messi na ọtụtụ ndi ọzọ nwere aha na egwuregwu bọolụ na mbaụwa.
Mana Iceland abughị ndị a na-akwa aka ka onye ṅụrụ mmanaya.
Na afọ 2016 ha gbara mbọ ruo ọgba nke anọ na asọmpị mba Yurop akpọrọ Euro 2016. Ihe tụru ndị mmadu n'anya bu na ọ bu mbụ ha na-aga asọmpị Euro.
Argentina na ọnwe ha eritebeghị iko mbaụwa ọbụla kemgbe ha nwere mmeri na Copa Amerịka nke 1993.
Ndị na-akwadọ mba Ajentina n'ọgbọ egwuregwu kunyiri na nkeji 19 n'ime asọmpị ahụ ka Sergio Aguero jiri otu ọkpụ dọkaa neeti ndị Iceland
Mana, ọchị di ha n'ọnụ gbachapụrụ n'elekere 22 mgbe Aisland, site na ọkpụ Finbogasson saghachịrị goolu ahụ we mezuo ya otu otu na mmechi agba nke mbụ.

Ebe foto si, AFP
Na nkeji 51 na agba nke abụọ, Aisland ritere corner kick nke Sigurdsson gbara ha mana ọ pụtaghị ihe.
Eji Bigblia gbanwe Banega nke Ajentina kwa na nkeji 54.
Messi a na-atụ anya na ọ ga-edu ndị Ajentina nke ọma gbahie lu ọkpụ penariti na nkeji 64.
Messi gbahielu ọkpụ nke abụọ ya na nkeji 81.
Ka o ruru nkeji 84, Ajentina mere mgbanwe nke atọ na nke ikpeazu ha n'iwepu Meza tinye Higuain.
Ka agba nke abụọ na-abịa n'isi njedebe Haldorsson bụ onye nche goolu aisland e chetala ihe rurugoolu ato n'aka ndị Ajentina.
Na ọma oge e nyere, Leonardo Messi gbara penariti mana ọ banyeghị n'ime neeeti dịka ogbu opi si gbuo ị ji gosi n'oge ezuwo.
Ya mere na ọ pụtara sọsọ otu goolu ka Ajentina na Aisland jiri laa taa.












