World Cup 2018: Enweghị onye meriri ibe ya ka Pọtugal na Spen gbara 3-3

Ebe foto si, Getty Images
Enweghị onye meriri ibe ya ka Pọtugal na Spen gbara bọọlụ tọkasịrị ndị mmadụ ahụ n'abalị a.
Daalụ maka isonyere anyị anyị taa. Sonye anyị ọzọ echi.
Nkeji iri itoolu na atọ: Ronaldo nyere ndị na-akwado ya ọbara mgbali elu oge ọ dị ka o merụrụ ahụ. Mana enweghị ihe mere ya, naanị ọtịta ngwere.
Nkeji iri itoolu: Ogbu bọọlụ etinyela nkeji anọ a ga-eji agbakwu bọọlụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nkeji iri asatọ na asaa: GOOOOLLLLUUU! Ronaldo ejirila 'free kick' gbakaa neetị. Goolu nke atọ a Ronaldo nyere ga-eme ya goolu atọ n'ime otu egwuregwu (Hat-trick) nke mbụ a ga-agba n'asọmpi a.
Nke a ga-eme ya goolu atọ n'otu egwuregwu nke 51 Ronaldo na-enye kemgbe o bidoro ịji bọọlụ akpata ego nri.
Nkeji iri asatọ na ise: Spen ewepụla David Silva tinye Lucas Vazquez.
Nkeji iri asaa na itoolu: Pọtụgal ewepụla Goncalo Guedes tinye Andre Silva.
Nkeji iri asaa na asaa: Spen ewepụla Diego Costa tinye Iago Aspas.
Nkeji iri asaa na isii: Quaresma zọtara bọọlụ, gbaga ya nso neetị De Gea, mana onweghị isi.
Nkeji iri asaa: Spen ewepụla Iniesta tinye Thiago Alcântara.
Nkeji iri isii na itoolu: Pọtụgal ewepụla Bernardo Silva tinye Ricardo Quaresma.
Nkeji iri isii na asatọ: Pọtụgal ewepụla Bruno Fernandes tinye Joao Mario.
Nkeji iri isii na atọ: Rui Patricio bụ oche goolu ndị Pọtụgal ejirila aka ghọtuo bọọlụ ndị Spen chọrọ iji agbaka neetị ya.
Nkeji iri isii: Guerreiro agbaala 'free kick' ndị Pọtụgal nwetere, mana o nweghị isi.
Nkeji iri ise na asatọ: GOOOLLLUUU! Nacho agbakaala neetị ndị Pọtugal.
Nkeji iri ise na anọ: GOOOOOLLLUUU! Diego Costa ejirila 'free kick' gbakaa neetị ndị Pọtugal.

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji iri ise na atọ: Moutinho agbatuola Iniesta mere ka ndị Spen nweta 'free kick'.
Nkeji iri ise: Bruno Fernandes chọrọ igbari neetị De Gea, mana bọolụ ya eruteghị nso.
Nkeji iri anọ na isii: Ronaldo agbapụla bọọlụ ka a na-amalite agba nke abụọ.
Nkeji iri anọ na ise na ụma: Agaala ezumiike nke ga-ewe nkeji iri na ise.
Nkeji iri anọ na anọ: GOOOLLLLUUUU!!! Ronaldo adọkaala neetị ndị Spen. Nke a ga-eme ya goolu abụọ ọ na-enye n'egwuregwu a.
Nkeji iri abụọ na itoolu: David Silva gbara 'free kick' a, mana o nweghị isi.
Nkeji iri abụọ na asatọ: Fernandes akwatuola Isco, mere ka Spen nweta 'free kick'. Fernandes nwetara akwụkwọ edo edo maka ya.
Nkeji iri abụọ na anọ: GOOOLLLUUU! Diego Costa enyela goolu.
Nkeji iri na itoolu: 'Free kick' Ronaldo gbara biri n'ahụ ndị na-egbochi bọọlụ.
Nkeji anọ: GOOOLLLLUUUU! Pọtugal enyela goolu. Ronaldo agbakaala neetị ndị Spen ka De Gea dafere ebe ọzọ kama ebe bọọlụ gara.
Nkeji atọ: Pọtugal enwetala penariti ka Nacho gbaturu Ronaldo.
Otu Nkeji: Ndị mmadụ na-akụrụ Ronaldo aka ka ụkwụ ya metụtụ bọọlụ ugbua egwuregwu bidoro.
Pọtugal na Spen ezutebuola n'Iko Mbaụwa nke afọ 2010, ebe Spen ji otu ọkpụ goolu merie ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nọ n'oche Pọtugal: Bruno Alves, Manuel Fernandes, Andre Silva, Joao Mario, Anthony Lopes, Ruben Dias, Ricardo Pereira, Gelson Martins, Mario Rui, Ricardo Quaresma, Beto, Adrian Silva.
Ndị nọ n'oche Spen: Daniel Carvajal, Saul Niguez, Rodrigo Moreno, Thiago Alcantara, Lucas Vazquez, Alvaro Odriozola, Kepa Arrizabalaga, Cesar Azpilicueta, Nacho Monreal, Iago Aspas, Marco Asensio, Jose Reina.
Ndị Pọtugal bidoro bọọlụ: Rui Patricio; Cedric Soares, Pepe, Jose Fonte, Raphael Guerreiro; Bernardo Silva, Joao Moutinho, William Carvalho, Bruno Fernandes; Cristiano Ronaldo, Goncalo Guedes.
Ndị Spen bidoro bọọlụ: David de Gea; Nacho, Gerard Pique, Sergio Ramos, Jordi Alba; Sergio Busquets, Koke; David Silva, Isco, Andres Iniesta; Diego Costa.
Ihe a bụ egwuregwu mbụ Fernando Hierro ga-anọ n'oche dịka onye nchịkọta nke Spen.
Ka ọ fọrọ mkpụrụ ụbọchị ole na ole tupu asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2018 a bido, ndị Spen chụrụ onye nchịkọta ha bụ Julen Lopetegui maka na ọ chọrọ ịgafe Real Madrid.











