World Cup 2018: Ihe niile i kwesiri ịma n'ụzọ asaa

Promo image for the World Cup in charts story
    • Onye dere ya, Daniel Dunford na Nassos Stylianou
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News

Ọ bụ eziokwu na ndị Jaminị mara agba penaliti? Kedụ mkpa ọ dị ịbụ na be ụnụ ka a nọ n'asọmpi? Nakwa kedụ onye Meziko na-egbochi goolu nyerela goolu n'iko mba ụwa dịka Cristiano Ronaldo?

Dịka iko mba ụwa na-enwuru ọkụ, anyị ga-azaa ajụjụ ndị a na ndị ọzọ.

1. Kedụ ndị kacha merie n'iko mbaụwa?

Brazil bụ ọkaibe ma e kwuwe okwu mmeri n'iko mbaụwa dịka ha meriela ugboro ise. mmeri ikpeazụ ha bụ n'afọ 2002. A gbara na be ha n'afọ 2014, mana ha biri ka onye ụmengwụ na ọkara ikpeazụ (semi-final) ebe e nyere ha ọkụ asaa a satara otu (7-1)

Brazil emeriela n'iko mba ụwa ugboro ise, ebe Ịtali na Jamanị sochiri ha n'azụ

O nwebeghị mba anọghị na Yuropu ma ọ bụ Saụt-Amerika bulierela iko mbaụwa, ebe mmeri nke Jaminị, Spen, na Ịtali n'asompi atọ e mere n'ikpeazụ a na-egosi na Yuropu bu ụzọ site na mmeri iri na otu, ebe Saụt Amerịka nwerela itoolu.

2. Kedụ onye kachasị nye goolu?

Nwaafọ Jamini ọkpa na-aghọ nkọ n'inye goal bụ Miroslav Klose bụ onye kachasịrị nye goolu site na-inye goolu iri na isii n'asompi iko mbaụwa anọ. Ọ lara ezumike nka n'afọ 2016 mana ọ ga-aga Roshia dịka otu n'ime ndị ọrụ nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ ala ya.

Nwaafọ Brazil bụ Ronaldo bụ onye nke abụọ site na inye goolu iri na ise, asatọ n'ime so na mmeri nke mba ahụ meriri n'afọ 2002.

Miroslav Klose bụ onye kachasịrị nye goolu n'asompi iko mba kemgbe o bidoro site n' inye goolu iri na isii na asompi iko mba ụwa anọ. Ọ kacha mmadụ dịka Pele, Gerd Muller na Gary Lineker nye goolu

Nwa amala Fransị bụ Just Fontaine bụ onye kachasị nye gọolu n'otu asompi. O nyere goolu iri na atọ n'egwuregwu isii n'asompi afọ 1958.

3. Kedụ maka ndị egwuregwu ugbua?

N'ime ndị egwuregwu ndị nyerela goolu iri maọbụ karia na iko mbaụwa, naanị nwaafọ Jaminị na-agba n'etiti bụ Thomas Muller ga-eso aga Rọshịa dịka onye egwuregwu.

Iji sonyere nwa amala ya bụ Klose onye nke nọ ọkwa mbụ, Muller ga-agba mbọ inwetakarịa goolu ise o nyerela n'otu asompi.

Nwafọ Kolombia bụ James Rodriguez ritere nzere akpụkpọụkwụ ọlaedo ('Golden Boot') oge ọ ggbara n'ikpeazụ a, nye mere o mee ka o mere na mbụ, ọ ga e soro ndị bụ ọkaibe.

Thomas Muller bụ onye kachasị na ndị niile na-enyekarị goolu na iko mba ụwa ka na-agba bọọlụ. O karịrị ndị dịka Messi, Suarez na Cristiano Ronaldo,onye ya na nwafọ Meziko na egbochi goolu(defender) bu Rafael Marquez

Naanị otu onye ogbo goolu (defender) sonyerenụ bụ Rafael Marquez gbara afọ 39, onye ga-abụ nke ise ọ na-agbara mba Meziko iko mbaụwa nyereluola goolu dịka Cristiano Ronaldo.

4. Otu egwuregwu anaghị enyezi goolu ka ha si enyebu

Goolu ole enyere n'egwuregwu agbara n'iko mbaụwa ikpeazụ bụ nke pekarisiri na ndị niile a gbara kemgbe afọ 1966 - afọ mbụ ndị ọkacharamara n'okwu bọọlụ bụ Opta bidoro nwewa ndekọ maka nke a.

Agbanyeghị nke a, ihe dịka goal abụọ na ọkara bụ ihe e nyere n'egwuregwu ọbụla a gbara n'afọ 2014 bụ nke kachasị kemgbe asompi iko mbaụwa e mere na mba Spen n'afọ 1882.

Ọ dịka goolu a na-enye site n'akụkụ agbadala. Ezigbo ọmụmaatụ bụ iji iko mbaụwa a gbara ikpeazụ tụnyere nke mbụ Opta dekọrọ nke Ingland meriri na afọ 1966.

N'egwuregwu nke iko mba ụwa afọ 1966, e nwre bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ 77, nke bụ ugboro kwuru ugboro anọ karia nke a gbara n'afọ 2014 nke bụ naanị 20.

Na mgbacha asompi afọ 1966, e nwere bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ si etiti ọgbọ bọọlụ (outside the box) gbaa karịrị nke sị n'ọnụ igwe goolu, mana n'ime bọọlụ kpụ ọkụ n'ọnụ iri abụọ a gbara n'afọ asompi ikpeazụ nke afọ 2014, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e siri na ebe penaliti were gbaa.

5. Ingland nwere ike ịna asọ gani gani mana Premia Lig ka chị ọgbọ

Kemgbe mmeri ha nwere n'afọ 1966, Ingland agabeghị karịa agba nke anọ otu ugboro. Mana nke a akwụsịghị mba ndị iji ụmụafọ ha na-agba bọọlụ na otu egwuregwu na-agba n' Premia Lig.

Na agbanyeghị ndị kara aka n'a bọọlụ dịka Leroy Sane, Marcos Alonso na David Luiz hapụrụ ụlọ, Premia Lig nwetara ndị egwuregwu karia ndị ọzọ.

E nwere ndị egwuregwu 130 so na iko mbaụwa aha ha dị na klọb ndị so na lig atọ kachasị n'Ingland oge a kpọpụtara ndị ga-esonye, iji tụnyere 81 si mba Spen nakwa 67 si Jamanị. Uregwayị, Panama, Sawudi Arebia na Rọshịa bụ naanị mba akpọghị ndị ọgba bọọlụ mba ha nọ Ingland.

Ingland bụkwa naani otu mba ebe mmadụ 23 na-agbara ha bọọlụ si n'otu otu egwuregwu. n'aka nke ọzọ, Swidịn na Senegal bụ - naanị mba abụọ enweghị ndị na-agbara ha bọọlụ bụ ndị si na otu egwuregwu ndị ụlọ ha (local league).

Ingland bụkwa naani otu mba ebe mmadụ 23 na-agbara ha bọọlụ si n'otu otu egwuregwu

6. Kedụ ka ndị otu egwuregwu ndị na nọ be ha si mee?

O nweghị onye nọ na Brazil a ga-echetara na ha bụ ndị e hiwere iko mba ụwa ugboro abụọ na be ha. Ndị obere agbata bi ha bụ Uregwayị ịgbagbu ha nara ha iko n'afọ 1950 nakwa Jaminị iji ọkpụ goolu asaa asatara otu gbagbu ha n'afọ 2014 bụ nnukwu ihe ihere nyere mba ha.

Mana ọtụtụ mba na-emekarị ọfụma karịa ma ha nwee nkwwadọ ụlọ. Rọshịa na-enwe olileanya na ha ga-eso ụtọukwu a nakwa na ha ga apụta n'otu ha nakwa nke Uregwayị, Ijipt na Saụdị Arebia.

Ọ bụrụ na ha mee otu a, Saụt Afrika ga abụ naanị otu mba e hiwere iko mba ụwa n'be ha agbapụrụ n'agba nke mbụ.

Mba isii- Uregwayị, Italị, Ịngland, Fransị, Jamanị na Agentina - bụ mba buliterela iko mba ụwa dịka mba e hiwere asompi ahụ na be ha. Naanị Brazil na Spen bụ mba ndị agbaghị ka a tụrụ anye oge e hiwere ya be ha

7. Ịgba Penaliti

O nweghị akụkọ iko mbaụwa n'ezu oke ma o bighị na penaliti.

Naanị otu onye Jamanị bụ onye agbataghị ya n'iko mba ụwa, ebe ha gbatachara penaliti anọ ha gbarala. Kemgbe ha nwetachara 15 n'otu ọgbara kemgbe afọ 1982.

Ọgbagwojughị onye ọbụla anya na Ingland bụ otu egwuregwu kacha njọ na iịgba penaliti, dịka ha gbara aka na penaliti atọ ha gbarala, na emerighị nke ọbụla.

A kpụkwara Italị n'ụzọ gbawara obi ugboro atọ nke gụnyere mgbasa asọmpi 1994 oge ọgba bọọlụ pụrụiche bụ Roberto Baggio gbafere ball n'elu igwe goolu. Mana mmeri ha n'asọmpi 2006 ebe ha meriri mba Fransi tidara obi otutu ndị Itali ndị obi adịghị mma maka usoro boolu a.

Mba Jamanị bụ okaibe na ịgba penaliti. Ha emeriela ụgboro anọ na adaghị ma otu. Ingland kpụrụ afọ n'ala na penaliti atọ niile ha gbarala.

Ndị mere eserese a bụ Joy Roxas na Sandra Rodriguez Chillida

Usoro nhazi

Maka ihe gosiri 'otu egwuregwu a nọ be ha agba' na-enwekarị "pọints" ngụkọ anyị nwetara site na Fifa na-agụ pụtara dịka onyelaba onyelaba ma ọ bụru na e jiri penaliti kpebia onye meriri n'agba mgbapụ nakwa dịka mmeri maọbụ mgbagbu ma ọ bụrụ na mpụtara mee na mmezi oge (extra time).

Maka ihe gosiri 'ndị nka bọọlụ toro n'ụlọ' anyị tinyere mba iri na otu nwekachasị ndị egwuregwu na-agbara ha n'ala ha. Otu klọb ndị egwuregwu sonyere sị n'akwụkwọ nke Fifa wepụtara.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ