World Cup 2018: Goolu agwụ Pogba enyerela Fransị aka gba Ọstralịa 2-1

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu bọọlụ nke Fransị batara asọmpị a ka ndị ike ha kachasị dịka ndị butere iko mbaụwa mbụ nakwa ndị nwekarịrị ndị ọgba bọọlụ aha ha na-ada ụda ọfụma.
Ndị Ọstralịa bịakwara ya bụ ọgụ ka ndị anaghị atụ anya na ha ga-emeri, mana dịka ha nwere mmadụ dị ka Tim Cahill bụ anwụ anwụ n'asọmpị bọolụ, ha jidekwere nke ha.
Ka maazị Cahill bụ onye anya na-ekiri n'ọgbọ ndị Ọstralịa, Paul Pogba bụ onye Fransị anya anyi chọwara n'ọgbọ egwuregwu ndị Fransị.
N'ime nkeji abụọ Kyrian Mbappe nke Fransi nwere oche goolu ndị Ọstralịa obele nsogbu mgbe ọchọrọ ịgbakanye bọọlụ na ngụ mpio goolu, Ryan kunyere bọọlụ nke ahụ ga "corner".
Fransị biakwara nso inye goolu ka a ka nọ n'ịme nkeji ise ka Pogba zigara bọọlụ o ji "free-kick" gba ozi na elu mpio ndị Ọstralịa mana Ryan nwụchịkọrọ ya.
N'ime nkeji isii, Mooy nke Fransị bịakwara nso inye goolu ka bọọlụ oji isi kpịa kụrụ igwe goolu.
Etu a ka osiri kwụrụ ruo ọkara nke mbụ.

Ebe foto si, AFP
N'ọkara nke abụọ n'asọmpị a, ọkụ niile bidoro gbawa.
Ka aka jiri nkeji 12 banye okara ahụ Risdon kụtụrụ Griezmann, nke mere onye nhazị asọmpị jiri tụọ aka na penarịtị.
Griezmann tinyere ya bụ bọọlụ n'ime mpio ka nwata na-aracha ụtụ. Ryan amaghịdị nke mere macha.
Mana, ka Fransi ka na aracha ụtụ goolu ahụ, Umtiti nke Fransị chefụrụ na ọbụghị aka ka eji agba ya bụ egwuregwu, ọkachasi n'ime ọnụ goolu.
Jedinak nyere penarịtị ya ka ọ bụ onyinye onye rịjụrụ afọ. Ka ọ na akụ nkeji 64, ihe ọnụ na-ekwu bụ Fransị 1, Ọstralịa 1.
Pogba gosiri ihe eji na-akpọ ya aha mgbe ọ nyere goolu nke ya. Bọọlụ ya kpịara n'igwe goolu, mana nzigharị gosiri na ọ gahere akara goolu. Goolu ya mere ya Fransị 1, Ọstralịa 1.










