World Cup 2018: Gịnị ka ndị Naịjirịa chọrọ iji ọkụkọ mee na Rọshịa?

Ebe foto si, Getty Images
Egwuregwu bọọlụ bụ nnukwu ihe n'ụwa niile ma ndị niile na-asọ mpi na-etinye uchu ha niile ịhụ na ha meriri n'asọmpi ha.
Ha nwere ike ime ihe ọbụla ịhụ n'otu ha meriri asọmpi ha.
Ụfọdụ ihe a bụ iji ọkụkọ gaa n'ama egwuregwu asọmpi Iko Mbaụwa na Rọshịa dịka ndị nkwado Naịjirịa si jụọ ndị Rọshịa.
Gọọmenti Rọshịa ekweteghi na arịrịọ ndị Naịjirịa rịọrọ iji ọkụkọ banye ama egwuregwu oge ndị Super Eagles ga-agba bọọlụ echi.
Mana ha kwuru na ọ bụrụ na ndị Naịjirịa gbaa isi akwara, ha agwakwa ha ebe ha ga-azụta ọkụkọ ahụ mana ha agaghị ejili ya baa n'ama egwuregwu nke Kaliningrad ebe Naịjirịa ga-agba mba Kroeshịa.
Mịnịsta mba Rọshịa na-ahụ maka omenala bụ Andrei Ermak gwara ụlọakụkọ mba Rọshịa a kpọrọ, Interfax sị : Ndị bọọlụ na-amasị sị Naijrịa jụrụ ma ọ ga-ekwe omume ka ha jiri ọkụkọ bata amaegwuregwu. Anyị gwara ha na ọ gaghị ekwe omume."
Cheta n'asọmpi iko mbaụwa nke afọ 2010 nke mere na Saụt Afrika, a machiri ndị nkwado Super Eagles iji ọkụkọ e tere uhie njirimara Naijiria n'ahụ banye amaegwuregwu Ellis Park dị na Johanesbọg maka asompi ha na Agentina.
Ajụjụ dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ gịnị ka ha eji ọkụkọ eme n'ama egwuregwu?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Ebe ụfọdụ na-ajụ ihe mere na mba Rọshịa eneyghị ha ohere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4
Ụfọdụ kwuru na ọbụ iji nọchie ugo bụ njirimara ndị 'Super Eagles.'
Mana ugo na ọkụkọ a bụ otu ihe? Ha enwere nyiri?
Otu onye kwuru na ebe ọ bụ na agaghị enwetali ugo, ka ha jiri ọkụkọ nọchie anya ya ka ọbụ na ha chọrọ iji ya gbaa afa?
O nweghị onye ma ebumnobi ha ma ncha.
Mana a ga-ahapụzị ịkpọ otu egwu bọọlụ Naịjịrịa 'Super Eagles' kpọwazie ha ' Super Chicken' ebe ọ bụ na ọkụkọ bụ ihe dị mfe inweta?
Ihe ịtụ n'anya bụ na ọ bụghị naanị ndị Naịjirịa na-eji ihe nkwenye aga n'ama egwuregwu, mana ndị ọzọ na-emekwa anwansi nke ha n'oge asọmpi.
Lee ihe ndị na-agba bọọlụ na ndị nkwado ha na-eme n'asọmpi
- Ụfọdụ otu egwuregwu na-agwa ndị nkwado ha ka ha yiputa uwe ime ahụ ha n'ihe
- Ịdebe ihe n'akụkụ goolu: Ụfọdụ ndị na-agba bọọlụ ekwuola na ha na-edebe ihe n'akụkụ ebe goolu iji hụụ na ha meriri n'asọmpi ha
- Ịnyụ mamịrị n'etiti ama egwuregwu: Ụfọdụ ndị na-agba bọọlụ kwuru na onye na-echere ha bọọlụ na-anyụ mamịrị n'etiti amaegwuregwu tupu e bido ịsọ mpi oge ndị mmadụ ga-eche na ha na-ekpe ekpere ma ndị otu ya nọchichere ya. Ụfọdụ na-anyụ mamịrị n'akụkụ anọ amaegwuregwu ahụ iji hụ na otu ha meriri
- Ịwụsa mmiri nsọ n'ama egwuregwu: O nwere oge a hụrụ onye bụbu onye nkuzi ndị mba Itali bụ Giovanni Trappatoni ebe ọ na-efesa mmiri nsọ n'ama egwuregwu.
- Ụfọdụ na-eji ihe a gwọrọ agwọ: Oge ụfọdụ na mpaghara Afrịka, ndị na-akwado bọọlụ na-eji ite ọgwụ abịa n'ama egwuregwu iji chụpụ ajọ mmụọ. N'asọmpi nke mpaghara Afrịka n'afọ 2008,ụfọdụ ndị na-akwadọ ndị otu ha ji ite ọgwụ bịa ebe ndị ọzọ ji ọgazi.

Ebe foto si, Getty Images