England, Poland ga-eso Super Eagles sọọmpi enyi na enyi

Ebe foto si, Getty Images
Naijiria na ala Poland, Serbia, DR Congo, England na Czech Republic ga-asọ mpị enyi na enyi maka nkwadebe iko mba uwa ga-eme na ala Russia na afọ 2018.
Otu Super Eagles na Poland ga asọ mpi n'ụbọchị ịrị na atọ na onwa Maachi.
N'ụbọchị anọ ga-abịa n'iru ka Naijirịa na Serbia ga-asọmpi.
Otu England na Naijiria ga-asọmpi n'ubọchị abụọ n'onwa Juunu.
Ka o si ga-adị
Onye nkuzi otu Super Eagles bụ Rohr kwukwara na asọmpi nke a di ezigbo mkpa makana ọ ga dị ka egwuregwu ga-eme na Russia.
Nke a bụ asọmpị enyi na enyi niile nke Nigeria maka nkwadebe egwuregwu ịko mba uwa:
- Nigeria na Poland (March 23 na Poland)
- Nigeria na Serbia (March 27 na UK)
- Nigeria na DR Congo (May 28 na Abuja)
- Nigeria na England (June 2 na London)
- Nigeria na Czech Republic (June 6 na Austria)
Ndị Super Eagles Naịjirịa tozuru ịga asọmpị ịko mba uwa n'afọ 1994, 1998, 2002, 2010 na 2014 mana ha agaghị n'afọ 2006.









