World Cup 2018: Salah Ebee ka Gimenez gbakara neetị ha

Ebe foto si, Getty Images
Gimenez nke Yuregụaị nyere goolu nyere ha mmeri ka ha na ndị Ijipti zutere taa.
Goolu a Jose Gimenez nyere ga-eme ya mbụ ndị Yurugụaị na-emeri egwuregwu mbụ ha na-agba asọmpi Iko mbaụwa kemgbe afọ iri anọ na asatọ.
Nkeji iri itoolu na isii: Enyela Hegazi akwụkwọ edo edo maka ịkụtụ Suarez ahụ.
Nkeji iri itoolu na-atọ: E nyela Morsy akwụkwọ edo edo.
Nkeji iri itoolu: GOOLU! YURUGỤAỊ agbakaala neetị! Sanchez si n'aka nri gbaa 'free kick' nke Gimenez ji isi tabanye n'ime poostu.
Nkeji iri asatọ na asatọ: Ọ gbafuola ya. Cavani gbara 'free kick' nke El-Shenawy echenwughị.
Nkeji iri asatọ: Ọ GHỌRỌLA YA! El-Shenawy egosila onwe ya ọfụma taa.
Nkeji iri asaa: Sanche na-achọ inye goolu, nye ya Cavani ma na ọ gbara n'aka Caceres, nke butere nke bekee kpọrọ 'free kick'.
Nkeji iri isii na atọ: Ijipti etinyela Kahraba wepụ Mohsen.
Nkeji iri ise na asatọ: Yuregụaị ewepụla Nandez tinye Sanchez.
Nkeji iri ise: Ijipti ewepụla Hamed tinye Morsy
Nkeji iri anọ na abụọ: Suarez agbaala shọọtụ atọ n'ime egwuregwu a, ebe Ijipti gbatara shọọtụ abụọ, Mana enwebeghị nke bụ nsogbu.
Nkeji nke iri abụọ na atọ: Suarez gbara bọọlụ mere ka ọ na-aga nso poostu, mana ọ gbafuru ya.
Nkeji nke iri na otu: Trezeguet ji obi butuo bọọlụ, mana shọọtụ ọ gbara abanyeghị ọfụma, nke mere ka onye nche gooolu ndị Ijiptị bụ Muslera, kụpụta ya.
Nkeji nke asatọ: Cavani gbara shọọtụ si n'ezi neetị, nke onye nche goolu Ijipti bụ El-Shenawy kụpụtara.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Ijipti na Yuregụaị zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ga-eme ya egwuregwu nke abụọ a ga-agba na ya bụ asọmpi.
Onye egwu ndị Ijipti bụ Mohamed Salah, esoghị bido bọọlụ (ọ nọ n'oche ndị e nwere ike itinye n'egwu).
N'otu aka ahụ, Luis Suarez na Edison Cavani bụ ndị egwu otu Yurugụaị bidoro egwu, ma na-egosi nd Ijipti ihe e ji mara ha.
Na Salah esoghị akwụsịghị ndị otu ya ịgba bọọlụ ka ike ha ruru, maka na ha gosiri ndị Yurugaị na otu onye anaghị emejuputa otu.
Ndị nọ n'oche Yurugụaị: Martin Campana, Martin Silva, Cristhian Stuani, Sebastian Coates, Diego Laxalt, Jonathan Urretaviscaya, Gaston Silva, Carlos Sanchez, Maxi Gomez, Lucas Torreira, Maxi Pereira, Cristian Rodriguez.
Ndị nọ n'oche Ijipti: Essam El Hadary, Sherif Ekramy, Ahmed El Mohamady, Omar Gaber, Sam Morsy, Mohamed Salah, Kahraba, Ayman Ashraf, Ramadan Sobhi, Mahmoud Hamdi, Shikabala, Saad Samir.
Ndị Yurugụaị bidoro bọọlụ: Fernando Muslera; Guillermo Varela, Jose Gimenez, Diego Godin, Martin Caceres; Nahitan Nandez, Rodrigo Bentancur, Matias Vecino, Giorgian de Arrascaeta; Edinson Cavani, Luis Suarez.
Ndị Ijipti bidoro bọọlụ: Mohamed El-Shenawy; Ahmed Fathy, Ahmed Hegazi, Ali Gabr, Mohamed Shafy; Mohamed Elneny, Tarek Hamed; Amr Warda, Abdallah El Said, Trezeguet; Marwan Mohsen.
Nzukọ ha nke a mere ya ugboro abụọ otu abụọ a ga-ezukọ, nke mbụ bụ oge Yuregụaị meriri ha na be ha n'afọ 2006.
Ihe ọzọ bụ na enwebeghị mba Afrịka ọbụla meriturula mba Yuregụaị n'asọmpi Iko Mbaụwa.











