Bobi Wine ekwuola na ya agaghị agbagha mpụtara ntuliaka onyeisiala Yuganda

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu pati na-agba gọọmenti ụkwụ na mba Yuganda bụ Bobi Wine agwaala BBC na ya agaghị agbagha mpụtara ntuliaka onyeisiala mba ahụ mere n'ụbọchị Tọzde 15 Jenụwarị 2026 n'ụlọikpe.
O kwukwara na ọ bụ maka na ya enweghị ntụkwasị obi n'ebe ndị ọkaikpe nọ, kama ọ gwara ndị na-akwado ya ka ha gaa n'okporoama mee ngagharịiwe udo.
Mgbe ọ na-agwa BBC okwu site n'ebe o zoro ezo, o kwuru na ya ga aga n'ihu na-ama Onyeisiala Yoweri Museveni aka n'agbanyeghị nchegbu maka nchekwa ya.
"A nwụchiri ndị ọkaikpe na Yuganda, anyị na-agbakwa ndị Yuganda ume ka ha jiri ụzọ ọ bụla iwu kwadoro lụọ ọgụ ichekwa ọchịchị onye kwuo uche ya," ka onye bụbu oti egwu pop dị afọ iri anọ na atọ kwuru.
Cheta na Museveni, dị afọ iri asatọ na otu, meriri ntuliaka ahụ site na nnukwu pasentị ma boo ndị na-agba gọọmenti ụkwụ ebubo na ha chọrọ ịgbanwe mpụtara ntuliaka ahụ site na ime ihe ike, na-akpọ ha "ndị na-eyi ọha egwu".
Wine, onye ezigbo aha ya bụ Robert Kyagulanyi, na-ekwusi ike na mpụtara ntuliaka ahụ bụ "adịgboroja" ma kwuo na ọ bụ site na "itinye akwụkwọ vootu" n'enyeghị nkọwa ọ bụla.
N'oge a na-agba ya ajụjụ ọnụ ya, Wine katọkwara ndị ọrụ nchekwa maka na ha ekweghi ka nri bata n'ezinụlọ ya ebe nwunye ya na ndị ikwu ya nọ n'ụlọmkpọrọ. O kwuru na ọ gbapụrụ n'ụlọ ahụ, n'ime ime obodo dị na Kampala, n'abalị Fraịde mgbe ndị nchekwa wakporo ya.
Yoweri Museveni emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Yuganda nke ugboro asaa ya

Ebe foto si, getty image
Onyeisiala Yoweri Museveni enwetal mmeri nke ugboro asaa na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Yuganda.
Ihe nke a pụtara bụ na Museveni gbara afọ 81 ga-achị mba Yuganda n'afọ ise na-abịa.
Mpụtara ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka wepụtara, gosiri na Onyeisiala Museveni ji vootu dị pasenti 72 merie Bobi Wine nwetere naanị vootu dị pasenti 25.
Mana Bobi Wine jụrụ ịnabata mpụtara ahụ nke ọ kọwara "mpụtara adịgboroja" mana Museveni ekwubeghị ihe ọbụla maka ebubo ahụ Wine boro ebe ndị otu African Union bịara hụ etu ntuliaka ahụ si gaa, kwuru na ha ahụghị ihe ọbụla gosiri na mpụtara ahụ bụ mpụtara adịgboroja dịka Bobi Wine si kwuo.
Museveni anọọla n'ọchịchị dịka onyeisiala mba Yuganda kemgbe n'afọ 1986 ma merie ntuliaka asaa niile kemgbe ahụ nke gụnyere ntuliaka a e mere n'ụbọchị Tọzde 15 Jenụwarị, 2026.

Ebe foto si, getty image
Bobi Wine gbara afọ 43, kwuru na ọtụtụ nrụrụaka na ọgbaaghara juputara na ntuliaka ahụ ma kwuo na e gburu ihe ruru mmadụ 21 na Yuganda na nso nso a.
Ndị ọchịchị ekwupụtala na mmadụ asaa nwụrụ.
Oge ọ na-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Simon Byabakama kpọrọ oku ka ndị nkwado pati niile zọrọ ntuliaka ahụ nakwa ọhanaeze niile nabata mpụtara ntuliaka ahụ
Mpụtara nke mbu na-egosi na Museveni na-emeri na ntuliaka Yuganda

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mpụtara nke mbụ na ntuliaka Onyeisiala mba Yuganda nke e mere n'ụbọchị Tọzde abalị iri na ise nke ọnwa Jenuwarị 2026 na-egosi na Onyeisiala Yoweri Museveni na-emeri.
Mpụtara nke ewpụtara na nso nso a n'ụbọchị taa bụ Fraịde abalị iri na isii tinyere Museveni n'ihu mmeri dịka o nwere pasentị 76 na ntuliaka site na mpụtara pasentị 45 ndị enyochara n'ogige ebe ndị a tụrụ vootu.
Bobi Wine bụ onye chọrọ iweghara ọchịchị n'aka Museveni nwere sọsọ pasenti 20 na mpụtara ndị enyocharala.
Cheta na Yoweri Museveni nọ n'ọkwa ọchịchị kemgbe afọ 1986 na-achọ mmeri nke ugboro asaa ya.
Patị Bobi Wine bụ 'National Unity Platform (NUP) ekwuola na ndị nchekwa nakwa ndị uweojii agbala ebe obibi Wine nọ n'isi obodo Yuganda bụ Kampala okirikiri "ma tunye ya na nwunnye na mkpọrọ nke ụlọ"
E nwebeghị ihe dịka ngagharịiwe na-eme ugbua.
Dịka kọmishọna na-ahụ maka ntuliaka si kwuo, a na-atụ anya na a ga-akpọpụta mpụtara ikpeazụ nke ntuliaka onyeisiala n'elekere anọ nke mgbede n'ụbọchị Satọde.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ntuliaka maka ọkwa onyeisiala na ndị nnọchiteanya ụlọomeiwu na mba Yuganda amalitela n'agbanyeghị na-enwere ihe ndọghachi azụ dịka akụrụngwa eji atụ vootu abịaghị ngwa ngwa n'ụfọdụ ebe dị iche iche.
BBC chọpụtara na ntuliaka amaliteghị n'elekere asatọ nke ụtụtụ n'ebe ntuliaka ise dị n'isi obodo Yuganda bụ Kampala ka ọ gachara otu awa oge ekwesịrị imalite ntuliaka.
Ihe mere ejighị malite n'oge bụ n'ihi akụrụngwa eji achọpụta onye kwesịrị ịtụ vootu nke bekee kpọrọ ' biometric identification kits' arụghị ọrụ nke ọma nke ndị mmadụ sị na ihe kpatara ya bụ maka ịntaneti akwụsịtụrụ ọrụ na mba ahụ.
N'ọkwa onyeisiala, Yoweri Museveni dị afọ 81 onye nke chịrịla Yuganda opekatampe afọ iri anọ na-achọ ilaghachite n'oche nke ugboro asaa.

Ebe foto si, Reuters
Akụkọ kwuru na akụrụngwa eji enyocha ma mmadụ o kwesịrị ịtụ vootu n'ogige ebe ọ nọ na-enwe nsogbu na mpaghara dị iche iche.
"Ufọdụ akụrụngwa eji enyocha onye kwesịrị ịtụ vootu arụghị ọrụ. A maghị m ma ọ bụ maka ịntaneti", onye ọrụ pati na-achị achị gwara ndị ntaakụkọ AFP.
Mana ọ bụghị sọsọ akụrụngwa eji enyocha ndị kwesịrị ịtụ vootu arụghị ọrụ kpatara oge e gburu tupu amalite ịtụ vootu, ihe ọzọ bụ na akwụkwọ eji atụ vootu n'ihe ndị ọzọ bịara n'oge adịghị anya"
"Anyi rutere ebe anyị kwesịrị ịtụ vootu n'oge mana akụrụngwa eji atụ vootu anọghị ya, onye na-atụ vootu na Kampala gwara ụlọọrụ mgbasaozi UBC TV nke steeti nwe.
Onye ntaakụkọ BBC kọwara na ndị mmadụ nwere oke nkụda mmụọ maka akụrụngwa eji atụ vootu na abịaghị ọsịsọ mana ndị ọrụ ntuliaka enwebeghị ihe ha kwuru gbasara nkea. Nsogbu a metụtara ebe niile.
Ntuliaka onyeisiala Yuganda bụ ịma aka mmadụ abụọ dị n'etiti Museveni bụ onyeisiala na onye na-agụ egwu mechara tụgharịa bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Bobi Wine.

Ebe foto si, Getty Images
E nwere mmadụ isii ndị ọzọ sọ Museveni na Bobi Wine azọ ọkwa onyeisala. Ndị na-atụ vootu ga-aghọrọ kwa mmadụ narị atọ, iri ise na atọ ndị ga-anọchiteanya ha n'ụlọomeiwu Yuganda.
Ndị na-atụ vootu nke ọnụọgụgụ ndị gbara afọ iri atọ karịrị ga-elekwasị anya n'ihe gbasara nsogbu akụ na ụba, enweghị ọrụ nakwa ọnụego ihe na-agbali elu ma ha na-atụ vootu.
Ọtụtụ ndị nnyocha kọwara na ebe Museveni emeriela ntuliaka onyeisiala ugboro isii, nkea nwereike ị bụrụ ya ụdara mmịcha.
N'aka nke ọzọ, Wine, dị afọ iri anọ na atọ kwere nkwa ịbuso nrụrụaka ọgụ nakwa inweta mgbanwe dị iche iche ga-akwalịte ọnọdụ ndị Yuganda.

Ebe foto si, Reuters
Cheta n'oge a na-achụ nta vootu, patị chọrọ iweghara ọchịchị bọrọ ebubo na gọọmenti na-emegide ha dịka akụkọ kwuru na ndị nchekwa nwuchiri mana emegide ndị na-eso Bobi Wine.
N'oge adịghị anya, ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Yuganda sị na meyụrụ ịntaneti iji gbochie ozi ezighi ezi, aghụghọ na ịkpalite ime ihe ike mana ụlọọrụ na-ahụ maka ikike dịrị onye na otu mba ụwa UN katọrọ omume a.
Ụfọdụ sị na ụlọọrụ mgbasaozi Yuganda chọrọ igbochi ndị otu chọrọ iweghara ọchịchị igosipụta ihe akaebe nke aghụghọ ntuliaka.

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe ụbọchị Satọọde, ndị nchekwa gbara Kampala, isiobodo Yuganda okirikiri, ebe ụfọdụ ụgbọala agha nọ na okporoụzọ dị iche iche.
Ụfọdụ ndị mmadụ mere njem si na Kampala ga n'ime obodo maka ha kwenyere na ha ga-enweta ezigbo nchekwa ebe ahụ dịka a na-eme ntuliaka
"Ntuliaka Yuganda na-abụkọma ihe ize ndu, ekpebiri m idebanye ebe m ga-eme ntuliaka ka ọ bụrụ n'ime obodo m", otu nwoke gwara BBC.
"O bi dị m mma na m mere mkepbi a, dịka ị na-ahụ, enwere ọtụtụ ndị nchekwa ebe niile na obodo. Dịka m ga-atụ vootu n'ime obodo m, e jikwa m ohere ahụ agbanahị nsogbu nchekwa"
A ga-emechi ogige ntuliaka elekere anọ nke ehihe 16:00 local time (13:00 GMT) ụbọchị Tọsde mana ndị nọ na-ahịrị tupu emechie ga-atụkwa vootu.
Mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Yuganda ga-apụta ihe dịka ọge ehihe n'ụbọchị Satọde 17 Jenụwarị 2026 dịka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka si kwuo.
Ntuliaka Yuganda 2026: A machiela ịntaneti dịka a ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ụbọchị Tọzde

Ebe foto si, Universal Images Group/Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Yuganda agwala ụlọọrụ na-ekesa ịntanetị ka ha kwụsịtụ ọrụ maka ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị Tọzde 15 Jenụwarị, 2026.
Ha kwuru na ihe mere ha ji eme nke a bụ iji gbochie ozi ụgha a na-ekesa n'ịntaneti, nrụrụaka na ntuliaka ahụ, nchekwa ọhanaeze nakwa igbochi ọgbaaghara ọbụla.
Na mmalite ọnwa a, ụlọọrụ Uganda Communications Commission (UCC) kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị banyere mmachi ịntaneti abụghị eziokwu, ma kwuo na na ụlọọrụ ahụ kwụrụ chịm ịhụ na inye onye ọbụla ịntaneti na mba ahụ.
A machiri ịntaneti ruo otu izuụka na ntuliaka e mere na 2021 nke kpaliri ngagharịiwe nakwa ogbugbu ọtụtụ mmadụ.
Ụlọọrụ UCC kwuru na a ga-amachi ịntanetị ngwangwa ọ kụrụ elekere isii nke mgbede n'ụbọchị Tuzde 13 Jenụwarị, 2026 mana ha ekwughị oge a ga-ewepụ mmachi a.
Ndị na-eji ịntanetị ekwentị ekwuola na ha enweghịzi ike inweta ịntanetị, mana ụlọọrụ dị iche gụnyere ụlọ oriri na ọṅụṅụ ka nwere ịntaneti.
A na-ekwu na ndị obodo ga-enwe ike ịkpọ oku ekwentị ma ziga ozi SMS.
N'akwụkwọozi ha zigaara ụlọọrụ mgbasaozi ekwentị, UCC kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndịagha gwara ha ka ha machie ịntanetị.
Ha kwuru na mmachi a "bụ iji hụ na e nwere udo, chekwaa obodo ma gbochie ndị nwereike iji ịntanetị mee ihe ezighị ezi na ntuliaka ahụ."
Ntuliaka a a ga-eme n'ụbọchị Tọzde bụ nke ga-adị n'etiti Onyeisiala Yoweri Museveni gbara afọ 81 nọgoro n'ọchịchị kemgbe afọ 40 gara aga na Robert Kyagulanyi a maara dịka Bobi Wine gbara afọ 43
E nwere mmadị isii ndị ọzọ na-azọ ọkwa.
Onyeisiala Museveni na-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro asaa na-ekwe nkwa inye ndị Yuganda ọchịchị zuruoke.
N'aka nke ọzọ, Bobi Wine na-akpọku ndị obodo ka ha chekwaa vootu ha nke o kwuru ọ bụ ya ga-enweta mgbanwe n'obodo.
Bobi Wine kọwara ndị chepụtara atụmatụ ịmachi ịntanetị ahụ dịka ndị amaghị ihe.































