Ntuliaka Yuganda 2026: A machiela ịntaneti dịka a ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ụbọchị Tọzde

Ebe foto si, Universal Images Group/Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Yuganda agwala ụlọọrụ na-ekesa ịntanetị ka ha kwụsịtụ ọrụ maka ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị Tọzde 15 Jenụwarị, 2026.
Ha kwuru na ihe mere ha ji eme nke a bụ iji gbochie ozi ụgha a na-ekesa n'ịntaneti, nrụrụaka na ntuliaka ahụ, nchekwa ọhanaeze nakwa igbochi ọgbaaghara ọbụla.
Na mmalite ọnwa a, ụlọọrụ Uganda Communications Commission (UCC) kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị banyere mmachi ịntaneti abụghị eziokwu, ma kwuo na na ụlọọrụ ahụ kwụrụ chịm ịhụ na inye onye ọbụla ịntaneti na mba ahụ.
A machiri ịntaneti ruo otu izuụka na ntuliaka e mere na 2021 nke kpaliri ngagharịiwe nakwa ogbugbu ọtụtụ mmadụ.
Ụlọọrụ UCC kwuru na a ga-amachi ịntanetị ngwangwa ọ kụrụ elekere isii nke mgbede n'ụbọchị Tuzde 13 Jenụwarị, 2026 mana ha ekwughị oge a ga-ewepụ mmachi a.
Ndị na-eji ịntanetị ekwentị ekwuola na ha enweghịzi ike inweta ịntanetị, mana ụlọọrụ dị iche gụnyere ụlọ oriri na ọṅụṅụ ka nwere ịntaneti.
A na-ekwu na ndị obodo ga-enwe ike ịkpọ oku ekwentị ma ziga ozi SMS.
N'akwụkwọozi ha zigaara ụlọọrụ mgbasaozi ekwentị, UCC kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndịagha gwara ha ka ha machie ịntanetị.
Ha kwuru na mmachi a "bụ iji hụ na e nwere udo, chekwaa obodo ma gbochie ndị nwereike iji ịntanetị mee ihe ezighị ezi na ntuliaka ahụ."
Ntuliaka a a ga-eme n'ụbọchị Tọzde bụ nke ga-adị n'etiti Onyeisiala Yoweri Museveni gbara afọ 81 nọgoro n'ọchịchị kemgbe afọ 40 gara aga na Robert Kyagulanyi a maara dịka Bobi Wine gbara afọ 43
E nwere mmadị isii ndị ọzọ na-azọ ọkwa.
Onyeisiala Museveni na-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro asaa na-ekwe nkwa inye ndị Yuganda ọchịchị zuruoke.
N'aka nke ọzọ, Bobi Wine na-akpọku ndị obodo ka ha chekwaa vootu ha nke o kwuru ọ bụ ya ga-enweta mgbanwe n'obodo.
Bobi Wine kọwara ndị chepụtara atụmatụ ịmachi ịntanetị ahụ dịka ndị amaghị ihe.










