A ga-ata nne Shekau ụta maka ọzụzụ nwa ya?

Ebe foto si, AFP
Ndị ọkammụta na mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ 'Sociologists' na bekee ekwuola oke mkpa nne dị na ntolite na agwa nwa ya.
Ha kwuru na nne na-akụziri nwa ya ọtụtụ ihe ga-abara ya uru n'obodo, dị ka onye bi n'etiti ndị ọzọ. Ihe ndị dịka nkwanyere ugwu, ịhụnaanya wdgz.
Nkọwa a na-apụta dịka ọ pụtara ihe na onye ndu Boko Haram bụ Abubakar Shekau, nwere nne mana o toro n'ezi na-enweghị ịhụnanya jịkọrọ nne na nwa oge ọ dị na nwata.
Nkwuputa afọ mụrụ Shekau bụ Falmata Abubakar mere nsonso a, gosiri na ọ maghị ebe ọ nọ kemgbe afọ 15 ọ pụrụ n'ụlọ dịka 'almajiri.'
Na mkparịtaụka mbụ ya na onye ntaakụkọ na-enwe, Falmata Abubakar gwara ụlọọrụ akụkọ "Voice of America" na ya "Amaghị ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. naanị Chukwu ma. Ahụbeghị ya kemgbe afọ iri na ise."
O kwukwara na nwa ya pụrụ n'ụlọ dịka 'almajiri' gawa mụta maka okpukperechi Islam.
Okwu ya butere ndọrịtaụka na soshal midia ebe ọtụtụ na-ekwu uche ha maka mkpughe ahụ nke gbanyere ụkwụ n'uru nne na ndụ nwa ya.
Isaac Wemmy kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obi ịmata na nwa onye na-akpa ụdị mkpamkpa a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Rebeccah Roberts, onye kwuru na mkparịtaụka nne Shekau mere ka 'ajọ anụ' ahụ bụ Shekaụ dịka mmadụ, tụrụ arịrị na ọtụtụ ụmụaka n'ala Naijiria na-achọ ịghọ Shekau ma ọ bụrụ na-akpachaghị anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akorede Khamael kwuru na o gosiri na ike nwa ya agwụla nne Shekaụ nakwa na ha bụ otu ọbara ma ha enweghị otu omume.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
N'okwu ya, onye ọkammụta 'Sociology' n'Ebonyi State University bụ Dr Nnachi Amos, kwuru na nne dị oke mkpa n'ezi otito nwa n'ihi na ọ na-eweta ịhụnanya na obiọma.
"Onweghị onye nwere nne na nna ga-eso na-eme ụdịrị ihe ha (ndị Boko Haram) na-eme.
"Ọ bụrụ na ị maghị nne gị, ị maghị nna gị, a sị gị gaa gbuo mmadụ, ị ga gbuo. Onye nwere nne, na-eche etu ihe ọ chọrọ ime ga-esi metụta nne ya maọbụ ndị ezinaụlọ ya."
Nnachi kọwara na ụfọdụ ụmụaka tara ahụhụ oge ha pere mpe, oge ha tolitere, iwe ahụhụ ahụ ga-eme ha ịta ndị ọzọ ahụhụ, igbu mmadụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










