Opụpụ Sarakị n'APC: Ọ tara akpụ ichutu Saraki n'ọkwa onyeisi Sineti - Okaiwu

Bukola Saraki

Ebe foto si, @bukolasaraki

Nkọwa foto, Saraki meriri n'ikpe ya dị n'aka ụlọikpe CCT
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Bukola Saraki bụ onyeisi ndị sineti hapụrụ pati họpụtara ya n'ọkwa bụ APC gawa PDP n'abalị a n'ozi o dere n'akara twitter ya.

N'ihi nke a, BBC Igbo gbara onye ọkaiwu a kpọrọ Obele Chuka bụ onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu n'Onicha bụ NBA n'ịchafụ ajụjụọnụ ka ọ kọwa ma e nwereike ichutu Saraki n'ọkwa.

Okaiwu Chuka kwuru na dịka Saraki kwuru na ọ bụ maka nsogbu dị n'ime pati APC mere o jiri hapụ ya, na iwu Naịjirịa kwadoro ya nke bụ na a gaghị achutu ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

O kwuru na ọ ga-ara ahụ ichutu Saraki maka na o nwere nkwado ọtụtụ ndị pati APC nakwa nke ndị PDP na Sineti ha karịsịa ma ọ bụrụ na ọ baa na pati PDP dịka ha na-ekwuzi na ọ bụ ha kachasị n'ọnụ ọgụgụ ndị Sineti.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọkaiwu Chuka kwuru na tupu a chutuo Saraki n'ọkwa dịka onyeisi ndị Sineti, na mmadụ karịrị ọkara n'ime ndị Sineti ga-akwado ka e me nke a.

Ọ gara n'ihu kwuo na "Ọ ga-arakwa ezigbo ahụ ichutu ya kpamkpam dịka onye omeiwu maka na dịka onyeisi ụlọomeiwu, ọ bụ ya nwereike ikwupụta onye a ga-achụtu maka ịhapụ pati họpụtara ya n'ọkwa.

Nke a mere ọ ga e ji taara ndị pati APC ezigbo akpụ ichutu Saraki n'ọkwa ma ọ bụrụ ha chọrọ ime nke a."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ