Ụlọọrụ onyeisiala: Mmeri APC gosịrị na Buhari na Osinbajo ịzọkọ na 2019 ga-eme nke ọma

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na ọ bụrụ na Muhammadu Buhari na osote ya bụkwa onye nke na-arụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osibanjo zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, na ha ga-eme nke ọma.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Garba Shehu kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere n'Aso Rock taa bụ Monde.
Garba kwuru na mmeri otu pati APC mere na ntuliaka ndị omeiwu e mere na steeti atọ na-egosi na mmeri bụ nke Buhari na Osinbajo n'afọ 2019.
"Ntuliaka kwuru utuliaka, ndị Naijiria na0egosi ntuụkwasị obi ha nwere na Buhari na Osinbanjo.
"Ntuliaka ọbụla na ndị a kajar akaja. maka na o o nweghị nke bụ obere n'ime ha.
"Obi dị anyị ụtọ na anyị meriri."
Ọ gara n'ihu kwuo na "Mmeri ndị a na-egosi na Buhari/Osinbajo ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ ọzọ ga-eme nke ọma."






