Ị ma na ị nwere ike iji N10,000 bido akaọrụ ndị a?
Ị ma na enwere ọtụtụ akaọrụ mmadụ nwere ike ime na-etinyeghị nnukwu ego na Naịjirịa?
1: Nri

Ebe foto si, Getty Images
Ebe ọ bụ na ndụ dị, iwu bụ na a ga-eri nri.
Nri bụ ihe a na-enweghị ike ịkwụsị ire n'ụwa, makana onye ọbụla kwesịrị iri nri maka ịdị ndụ.
Ebe ọbụla a na-ere nri, a ga-enwerila ndị ga-azụ ya. Ọtụtụ ndị na-ere nri kwuru na ha ji ihe dịka puku naịra iri wee bido akaọrụ a.
Ọ bụrụgodu kpekere maọbụ chin-chin, ebe ọ bụ ihe na-abanye n'ọnụ, ị ga-ahụ ndị ga-azụta ya.
2: Mmanya

Ebe foto si, Getty Images
Mmanya ụtọ, mmanya nkwụ na ngwọ, nakwa nke e si na mkpụrụ osisi emepụta nke Bekee kpọrọ 'Smoothie' bụ ihe mmadụ nwere ike na-etinyeghị ego buru ibu.
Etu i si mezie ya ga-eme ka ndị mmadụ zụọ maọbụ ghara ịzụ ya.
3: Mkpụrụ osisi

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụ osisi anaghị agwụ agwụ makana otu laa (kwụsị ịmị), mgbe ahụ ka ọzọ ga-apụta.
Makana e nwere mkpụrụ osisi nke na-apụta n'oge udummiri ma nwee nke na-apụta n'ọkọchị, akaọrụ a bụ nke ga na-eweta ego.
Ị na-ere ihe dịka oroma, ọ laa, ị bido rewe mangoro maọbụ ube na ndị ọzọ wdgz.
4: Ịsa akwa

Ebe foto si, Getty Images
Ibido akaọrụ a, ihe ị ga-achọta mmiri, gote ncha, efere ị ga-eji asa akwa na eriri ị ga-eji agbasa akwa ma ị saa ya.
Ihe ọzọ ị nwere ike ime bụ ịzụta igwe e ji ede akwa.
Ị nwere ike na-aga n'ụlọ ndị mmadụ na-asara ha akwa, ọkachasị ndị na-arụ ọrụ Bekee na-anaghị enwe ohere.
5: Ịkpa isi

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị na-akpa isi nwere ike ịbịa n'ụlọ gị kpaa gị isi, ụdịrị ọbụla ị chọrọ.
Ị nwere ike gwa ha zụta ihe ndị ha chọrọ iji kpaa isi, ebe ị ga-eji naanị mbọ isi nakwa ude isi bịa.
Ị kpaa ọtụtụ ndị isi, ị nwee ike nweta ego.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:












