Onye bụ Mojtaba Khamenei, onye ndu kachasị elu n'Iran a họpụtara ọhụrụ?

A na-atụ anya na nwoke dị afọ iri ise na isii ahụ ga-aga n'ihu n'ọchịchị siri ike nke nna ya.

Ebe foto si, Tasnim News Agency

Nkọwa foto, A na-atụ anya na nwoke dị afọ iri ise na isii ahụ ga-aga n'ihu n'ọchịchị siri ike nke nna ya.
    • Onye dere ya, BBC Persia
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ochiche a na-eche onye ndu ọhụrụ nke mba Iran ebiela: Onye ndu ọhụrụ apụtala.

Mojtaba Khamenei, nwa nwoke nke abụọ nke Ayatollah Ali Khamenei onye e gburu mgbe mba Amerịka na Izrel wakporo Iran bụ onye a họpụtara ga-anọchi ya.

Mojtaba dị afọ iri ise na isii ahụ , adịghị ka nna ya, anaghị anụ aha nke ọha na-ahụkarị ya.. O nwebeghị ọkwa ọchịchị o jirila, a hụbeghị ebe o kwuru okwu n'ọha nke a nahụ foto ya nọ na soshịal midịa.

Mana kepukepu na-ekwu na okwu ya bụ ihe e ji eme okwu n'azụ na mba Iran.

Akwụkwọ ozi mba Amerịka, nke WikiLeaks bipụtara na ngwụcha afọ 2000, kọwara Mojtaba dịka "ikike nke anaghị ahụ anya" onye a na-ewere dịka onye "ihe gbasara ya bụ ihe na-ada ụda" n'ime ọchịchị Iran.

Nhọpụta ya nwere ike ịbụ ihe ga-ese okwu. Ọchịchị mba ụka Alakụba ahụ e hiwere n'afọ 1979 dịka a kwaturu ọchịchị eze, nwere nkwenye na nhọpụta onye ndu dabere n'ụkpụrụ okpukperechi nakwa nka ịbụ onye ndu, na abụghị isi n'aka nna feere nwa.

Mgbe Ali Khamenei nọ n' ọchịchị, o kwughị hooha banyere onye ga-eweghara ọchịchị n'aka ya n'ọdịnihu.

Otu onye so na Ọgbakọ Ndị Ọkachamara nke Iran - otu ndi ụkọchukwu na-ahọpụta onye ndu kachasị elu kwuru afọ abụọ gara aga na Ali Khamenei megidere atụmatụ iwepụta nwa ya dịka onye ndu ọdịnihu mana o kwupụtaghị ya n'ọha.


A na-atụ anya na Mojtaba Khamenei ga-abụ onye ndu ọzọ ruo ihe karịrị afọ iri abụọ

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, A na-atụ anya na Mojtaba Khamenei ga-abụ onye ndu ọzọ ruo ihe karịrị afọ iri abụọ

Onye bụ Mojtaba Khamenei?

A mụrụ ya n'abalị asatọ nke ọnwa Sepụtemba afọ 1969 na obodo Mashhad. Ọ bụ nwa nke abụọ n'ime ụmụaka isii Ali Khamenei mụrụ. Ọ gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị na ụlọakwụkwọ okpukperechi Alavi nke dị na Tehran.

Dịka ndị ntaakụkọ Mgbe ọ dị afọ iri na asaa, Mojtaba nọtụrụ nwa obere na ọrụ nchekwa mgbe Iran na Iraq lụrụ agha.

N'afọ 1999, Mojtaba gara Qom, obodo dị nsọ ebe ndị mmadụ sị bụ ebe dị mkpa a na-amụ okpukperechi Shia ịga n'ihu na ọmụmụ okpukperechi.

Mojtaba ka bụ onye ụkọchukwu na-enweghị ọkwa dị elu nke nwere ike ibute ihe mgbochi na-nhọpụta ya dịka onye ndu kachasị elu.

E hiwere mba Islam n'afọ 1979 n'ụkpụrụ na a ga-ahọpụta onye ndu kachasị elu maka ọnọdụ okpukperechi onye ahụ nakwa nduzi.

Ebe foto si, West Asia News Agency Via Reuters

N'oge na-adịbeghị anya, ụfọdụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi na ndị ọrụ nọ nso n'ebe ndị ọchịchị dị na Iran amalitela ịkpọ Mojtaba Khamenei "Ayatollah", aha ndị isi ụkọchukwu. Ngbanwe a yiri ka ọ na-eme ka ụfọdụ ndị na-ekiri ihe na-eme dị ka mgbalị iji bulie ọnọdụ okpukpe ya elu ma gosipụta ya dị ka onye ndu a pụrụ ịtụkwasị obi.

N'usoro seminarị, a na-ewere ịbụ onye "Ayatollah" na ịkụzi klaasị dị elu dị ka ihe na-egosi ọkwa agụmakwụkwọ na ihe ọmụma mmadụ, a na-ewerekwa ya dị ka otu n'ime ihe achọrọ na ihe achọrọ maka ịhọrọ onye ndu n'ọdịnihu.

Mana e nweelarị ihe mbụ. A kwalitere Ali Khamenei ngwa ngwa dị ka "Ayatollah" mgbe ọ ghọrọ onye ndu nke abụọ kachasị elu na