Ọ tụwara nwaanyị ime gbaa ọsọ, ugbua nwa ahụ a mụtaara ya adịrịla ya ime

Ebe foto si, Getty Images
Nwata nwaanyị a kpọrọ Faith Adagu a dịrịla nna ya ime na amaghị na ọ bụ nna mụrụ ya.
Nnenne Faith, bụ Mary Adagu onye dị afọ iri isii dara n'ala nwụọ ka ọ nụrụ arụ dakwasịrị ezinaụlọ ya.
Dịka akwụkwọ akụkọ Sun siri kọwaa, nsogbu ezinaụlọ bidoro n'afọ 1997 mgbe nne Faith bụ Theresa bụ nwata akwụkwọ sekọndịrị na Lokoja na Jones Geya, onye ji otu afọ efe ala nna ya n' ụlọakwụkwọ ha, bidoro mewe enyi.
Theresa nọ n'ele ule Senịọ Sekọdịrị were dịrị ime mana egwu ekweghị ya gwa nne ya rue mgbe ime ya ruru ihe dịka ọnwa anọ oge nne ya chọpụtara.
Oge a kpọrọ Jones, o kwetara na ọ bụ ya nwe ime ma kwee nkwa na ya ga-alụ Theresa ka a gwachara ya na nna nne Theresa bụrụ nwa ya ọ bụla ga-ete ime ọnụ na ọ ga-anwụ ma o tee ime.
Mana oge Jones gwara nna ya na ọ chọrọ ịlụ Theresa, nna ya jụwara isi sị na nwa ya ka dị na nwata, na o nwekwaghị ezigbo ọrụ.
Jones were gbaa ọsọ n'Lokoja gbahapụ Theresa n'afọ ime.
Theresa mechara mụọ nwa ma gụọ ya, Faith. O mechara gaa mahadum, lụọ di, onye Osun steeti na-arụ n'ụlọakụ.
Mana egwu na di ya agaghị ekwe ka ọ kpọrọ nwa ya ka ya n'ezinaụlọ ya biri mere ka ọ hapụ ya na aka nne ya bụ Mary mana ọ na -ezigara ya ego e ji azụlite nwa ya.
Faith na nnenne ya bi na Lokoja ebe ọ gara akwụkwọ rue sekọndrị.
Oge Faith guchara sekọndrị, o nwetanwughị ohere ịga mahadum.

Ebe foto si, Getty Images
Enyi ya tụnyere nnenne ya alo ka Faith ga nweta nzere Diplọma n'Nasarawa State Polytechnic dị na Lafia kama ịnọ n'ụlọ na nkịti.
Ọ bụ na Lafia ka Faith na Jones zutere ma bido mewe enyi.
O diri ime, oge ọ gwara Jones, obi tọrọ ya ụtọ n'ihi na ọ mụbeghị nwa na agbanyeghị na- ọ lụọlarị nwaanyị ugboro abụọ; nke mbụ nwụrụ n'ịmụ nwa, ebe nke abụọ nwụrụ n'ihe mberede okpọrọụzọ ka ọ dị ime ọnwa isii.
Kepukepu ime Faith dị lutere Nne nne ya na nne ya ntị mgbe nwaanyị ya na nwa ha bi bụ Fatima Ajala zigara ha ozi.
Ha zara oku were gawa Lafia n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Novemba afọ 2018.
Ọ bụ oge Jones, zọchiri n'ụlọ ahụ ka ụkwụ jiri agụ.
Ngwa ngwa, Theresa hụrụ ya, anyamiri juru ya anya o were bee akwa arịrị n'ihe ihere dakwasịrị nwa ya nwaanyị.
"Ahụrụ m nwoke n'anya, o were laa ndụ m n'iyi gbahapụ m afọ iri abụọ gara aga na ajụghị ka m mere. Echezọla ya ma bido ndụ n'isi o lọghachi azụ bịa tụwa nwa ọ mụrụ ime. Agaghị m ezu ike ganye na ọ ta ahụhụ dịrị arụ o mere."
Jones dara n'ala ma rịọ Theresa mgbaghara. O kwuru na ọ bụ nna ya jụụ na ya agahị alụ Theresa.
O kwukwara na kemgbe ahụ n' ụwa ya ghara agha n'ihi na sọ ọsọ ihe ọjọọ na-eme na ndụ ya dịka onye a bụrụ ọnụ.
"Nwunye abụọ m lụụ nwụrụ n'ike n'ike. a chụọ m n'ọụ. Ọ bụ mbọ ịmụta nwa tinyere m n'ịyị Faith. Amaghị m n'ọ bụ nwa. Oge m jụụ ya ọ gwara m na nna ya anwụọla amaghị na nna ọ na-ekwu bụ papa nnukwu ya Emeghiela m Theresa. A na m arịọ ya ka o were nwaayọọ ka anyị dozie okwu a."
N'okwu ya, Faith tara nne na nna ya ụta maka ọdachi dakwasara ya.
"Nnenne m gwara m na nna m anwụọla. O ge m judoro Jones, ọ jụụ m ma agwa ya na nna m anwụọla. Amaghị na ọ bụ nna m.
"Ahụrụ m ya n'anya nke ukwu. Tupu mụ na ya adịwa mma, ụmụnwoke abụọ mụ na ha yị na-eme ka ụmụaka mana Jones pụrụ iche. Ihe mere emeela, agaghị ewepụ nwa n'ihi na amaghị maọbụ ya ga-abụ naanị nwa m ga-amụ n'ụwa a."









