Nwunye mmadụ ụkọchukwu tụwara ime anwụọla

Ngbeken Elvis

Ebe foto si, Ngbeken Elvis

"Ọ bụ onye amụma ụgha?", "Chineke ekpugheela mmehie gị"...

Ihe ndị a bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụkọchụkwụ tụwara nwunye mmadụ ime.

Ndị ọzọ na-ekwụkwa sị, "Gịnị ka ọ na-akuziri ndị na-ekpe n'ụlọụka ya?", "I kwere ya nkwa ịgọzi ya, O kwe gị nkwa ịkwụghachị gị ụgwọ; ụgwọ ahụ bụ afọ ime, ite ime nakwa ọnwụ ugba."

Nwoke a ọ ga-azanwukwa okwu na ụka a o ji isi kote?

Ngbeken Elvis dị afọ 32 na-ekpe ekpere niile dị n'ọnụ ya na-asị Chineke gbaghara ya maka mmiri ọkụ e ji egbu mbe ọ dabanyere n'ime ya ebe o soro nwunye mmadụ.

A nwụchiri Ngbeken bụ ụkọchukwu na 'Christ Chosen Church of God,' ka enyi ya nwaanyị a ma dịka 'Mama Sarah' bụ nwunye mmadụ nakwa nne ụmụ anọ, nwụrụ ebe ọ gara ite ime ọ tụwara ya.

Akụkọ kwuru na Ngbeken na Mama Sarah bụ onye di ya bi na mba ofesi, yịrị ọyị na nzuzo ọnwa isii.

A ga-agbaghara ya?

Dịka ụlọọrụ mgbasaozi The Nation si kwuo, Ngbeken kwuru sị " A matara m nwaanyị a bụ Mama Sarah oge ọ na-arịa ọrịa. E kpeere m ya ekpere, o kwe m nkwa ịkwụghachị m ụgwọọrụ.

"Anyị bidoro ime enyi nwoke na nwaanyị, mana ụmụ ya amaghị.

Oge otu nwa ya nwaanyị malitere ikpalite ntamu ka ndị agbataobi na-ajụ ihe kpatara m ji na-abịa n'ụlọ ha oge ọbụla, nne ya amajaa ya na ọ ga-achụpụ ya n'ụlọ."

Ọnwa atọ gara aga, ọ sị m kwabata n'ime ụlọ ha bụ ebe m bi ruo oge m nwetara ụlọ. Abụ m nwa enwe nne, e bughị m n'uche ibanye n'ụdị ọgbaghara a.

Ọ gwaghị m na ọ dị ime. Amaghị m na ọ gara ite ime mana ihere emegbuola m. Ekpere m bụ ka Chineke gbaghara m.

Echegharịala m. Ọ na-enyebu m N1000 maọbụ N2000 iji gaara ya ozi."

Aha onyonyo, Di na nwunye mụrụ ejima atọ

Ihe niile a Ngbeken na-ekwu abụghị ihe ezinaụlọ di Mama Sarah chọrọ ịnụ, ha chọrọ ka ndị ọgọ ha nyeghachị ha ụgwọ isi nwaanyị ha kwụrụ.

Ha ekwuola na Ngbeken ga-akwụ ụgwọ niile a ga-eji eli ya; nke a bụkwa ma ọ kwụchaa ụgwọ isi ya dịka nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị.

Ngbeken na-ekwu na ndị ụlọụka ya kwụsịrị ya ọrụ n'ike maka oke nsogbu ọ na-enwe n'alụmdinanwunye ya; o kwuru na nwunye ya na-aluso ya ọgụ kamgbe ha gbara akwụkwọ n'afọ 2016.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ