Nwunye mmadụ ụkọchukwu tụwara ime anwụọla

Ebe foto si, Ngbeken Elvis
"Ọ bụ onye amụma ụgha?", "Chineke ekpugheela mmehie gị"...
Ihe ndị a bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụkọchụkwụ tụwara nwunye mmadụ ime.
Ndị ọzọ na-ekwụkwa sị, "Gịnị ka ọ na-akuziri ndị na-ekpe n'ụlọụka ya?", "I kwere ya nkwa ịgọzi ya, O kwe gị nkwa ịkwụghachị gị ụgwọ; ụgwọ ahụ bụ afọ ime, ite ime nakwa ọnwụ ugba."
Nwoke a ọ ga-azanwukwa okwu na ụka a o ji isi kote?
Ngbeken Elvis dị afọ 32 na-ekpe ekpere niile dị n'ọnụ ya na-asị Chineke gbaghara ya maka mmiri ọkụ e ji egbu mbe ọ dabanyere n'ime ya ebe o soro nwunye mmadụ.
A nwụchiri Ngbeken bụ ụkọchukwu na 'Christ Chosen Church of God,' ka enyi ya nwaanyị a ma dịka 'Mama Sarah' bụ nwunye mmadụ nakwa nne ụmụ anọ, nwụrụ ebe ọ gara ite ime ọ tụwara ya.
Akụkọ kwuru na Ngbeken na Mama Sarah bụ onye di ya bi na mba ofesi, yịrị ọyị na nzuzo ọnwa isii.
A ga-agbaghara ya?
Dịka ụlọọrụ mgbasaozi The Nation si kwuo, Ngbeken kwuru sị " A matara m nwaanyị a bụ Mama Sarah oge ọ na-arịa ọrịa. E kpeere m ya ekpere, o kwe m nkwa ịkwụghachị m ụgwọọrụ.
"Anyị bidoro ime enyi nwoke na nwaanyị, mana ụmụ ya amaghị.
Oge otu nwa ya nwaanyị malitere ikpalite ntamu ka ndị agbataobi na-ajụ ihe kpatara m ji na-abịa n'ụlọ ha oge ọbụla, nne ya amajaa ya na ọ ga-achụpụ ya n'ụlọ."
Ọnwa atọ gara aga, ọ sị m kwabata n'ime ụlọ ha bụ ebe m bi ruo oge m nwetara ụlọ. Abụ m nwa enwe nne, e bughị m n'uche ibanye n'ụdị ọgbaghara a.
Ọ gwaghị m na ọ dị ime. Amaghị m na ọ gara ite ime mana ihere emegbuola m. Ekpere m bụ ka Chineke gbaghara m.
Echegharịala m. Ọ na-enyebu m N1000 maọbụ N2000 iji gaara ya ozi."
Ihe niile a Ngbeken na-ekwu abụghị ihe ezinaụlọ di Mama Sarah chọrọ ịnụ, ha chọrọ ka ndị ọgọ ha nyeghachị ha ụgwọ isi nwaanyị ha kwụrụ.
Ha ekwuola na Ngbeken ga-akwụ ụgwọ niile a ga-eji eli ya; nke a bụkwa ma ọ kwụchaa ụgwọ isi ya dịka nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị.
Ngbeken na-ekwu na ndị ụlọụka ya kwụsịrị ya ọrụ n'ike maka oke nsogbu ọ na-enwe n'alụmdinanwunye ya; o kwuru na nwunye ya na-aluso ya ọgụ kamgbe ha gbara akwụkwọ n'afọ 2016.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











