Zik bụ "ihe" nye ndị isi ojii - Saraki

Saraki na Azikiwe

Ebe foto si, Getty Images

N'emume iji cheta Nnamdi Azikiwe ama dịka "Zik nke Afrịka" so n'isi a hụrụ kwaba okpu n'ala Naịjirịa nakwa mbaụwa, naanị otutu juru Bukola Saraki ọnụ maka ya.

N'emume "Zik Lecture Series" e mere n'Ọka bụ nke asaa, Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa, kwuru na Zik mere ọtụtụ ihe ọma e ji echeta ya.

O kwuru na Zik bụ "Owelle ndị Ọnịcha" bụ onye anaghị akpa oke ma bụrụ "ihe" nye ndị agbụrụ isi ojii.

Ihe ise Saraki kwuru

  • Zik so na ndị bidoro usoro nnwereonwe ndị Afrịka, otu onye n'ime ndị amamihe, ọhụụ na ozi ha nakwa obi ike ha nyere aka gbapụta Naịjirịa n'aka ọchịchị Briten.
  • O kwuru na Zik mekwara ihe e ji mara aha n'ebe ụwa sọtụrụ; ịma atụ ya bụ okwu o kwuru na nzukọ udo ndị Briten mere na 1949, ebe zik gwara ha ka ha nye Naịjirịa nnwereonwe.
  • Zik bụ onye nwere ọgụgụ isi, onye ike dị n'uche ya jikọtara Naịjirịa na ndị isi ojii mbaụwa niile.
  • O kwuru na "Zik abụghị naanị onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwere akọnaụche, ọ bụkwa onye nkuzi, ọma mbem, onye na-ebiputa akwụkwọ nakwa ode akwụkwọ. O gosiri na ọ na-echebanye echiche ọfụma tupu o mee ihe. O chebanyere echiche ọfụma maka Afrịka ma chekwaa maka ụzọ Naịjirịa na-aga, ma gbalịa ituziri Naịjirịa aka n'ụzọ ọma ọ ga-esi.
  • Zik bụ onye anaghị akpa oke, o kwenyere na ndịnotu Naịjirịa ma gbaa mbọ ịhụ maka ya. Ọ bụkwa onye aka ya kwụ ọtọ, ma bụrụ otu n'ime ndị Afrịka agaghị echefu echefu.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Zik

  • A mụrụ ya n'obodo Zungeru dị na Naịja steeti.
  • Ọ na-asụ Igbo, Yoroba na Awụsa.
  • Ọ hibere ma bụrụ onye nwe akwụkwọ mgbasaozi a kpọrọ "West African Pilot".
  • Ọ bụ onye isi ojii Afrịka mbụ ga-akuzi na mahadum Lincoln dị na mba Amerịka.
  • Zik sọrọ mpi n'ihe egwuregwu dịka ịgba bọọlụ, ịpịa ọkpọ, igwu mmiri, ịpịa tenis nakwa ihe ndị ọzọ.
  • Zik banyere n'otu Agbalanze ndị Ọnịcha n'afọ 1946.
  • E chiri ya Owelle-Ọsọwa-Anya nke Ọnịcha n'afọ 1972.
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ