CCT si na Saraki ga-alaghachi ụlọ ikpe ha na Febụwari

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Code of Conduct tribunal nke dị n'Abuja eyinyela abalị isii nke ọnwa febụwarị dịka ụbọchị Gọọmenti Etiti ga-emepegharị akwụkwọ ikpe ya megịde onyeisi ndị Sịnetị bụ Bukola Saraki.
Danladi Umar bụ onyeisi oche ndị CCT kwenyere na mmepegharị akwụkwọ ikpe a megidere Saraki na nrube isi iwu ụlọikpe Appeal nke Abuja nyere n'abalị 12 nke ọnwa Dizemba 2017.
Onyeisi ndị Sịnetị na-azara ọnụ ya n'ebubo dị iri na asatọ n'oge mbụ, ga-ebido zara ọnụ ya n'ebubo dị sọnsọ atọ.
Ụlọikpe mkpegharị, nke a na-akpọ Court of Apeal na asụsụ bekee, n'ime nkwekọrịta ndị ọka ikpe ukwu atọ kwuru n'obi juru ha afọ na Saraki nwere azịza ọnụ n'ụlọ ikpe CCT
Ụlọikpe a kacha pụrụ ebubo dị iri na ise nke eboro Saraki, kwuo na Gọọmenti etiti enweghị ihe akaebe pụtara ihe megide ya.
Ndị akaebe anọ Gọọmenti Etiti kpọtara kwuru ihe ọzọ n'abụghị ihe Gọọmenti dere n'akwụkwọ.
Ụlọikpe a sịrị Saraki bịa zara ọnụ ya n'ime ebubo nke anọ, ise na isii ebe ekwuru na okwuputaghị akụ na ụba ya mgbe ọ gbaturu n'ọchịchị dịka Gọvanọ ndị Kwara Steeti n'akwa tupu owere ọchịchị dịka onyeisi ndị Sịnetị.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na Bukola Saraki pụtara n'ụlọikpe Code of Conduct Tribunal nke Danladi Umar bụ onyeisi oche izara ebubo kwuru na ọ tụrụ asị na nkwuputa akụ na ụba ya mgbe ọ bụ Gọvanọ ndị Kwara Steeti
Ebubo a kwuru na Saraki jụkwara ikwupụta ụfọdụ akụ na ụba onwetara dịka onye Gọvanọ.









